Come, Follow Me
Ojiji Bianụ, Soro M—Maka Ebe obibi na Nzukọ nsọ


“Ojiji Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)

di na nwunye na-amụkọrịta ihe ọnụ

Ojiji Bianụ, Soro M—Maka Ebe obibi na Nzukọ nsọ

Onye Ka Akụrụngwa Nke a Bụ Maka ya?

Bianụ, Soro M bụ maka onye ọbụla chọrọ ịmụ ihe site nʻakwụkwọ nsọ—onye ọbụla n’otu n’otu, dị ka ezi na ụlọ, ma niime klaasị Nzukọ nsọ niile. Ọ bụrụ ma ịmụbeghị akwụkwọ nsọ na-esepụghị aka n’oge ndị gara aga, akụrụngwa nke a nwere ike nyere gị aka malite. Ọ bụrụ na i nweworị agwa dị mma nke ịmụ akwụkwọ nsọ, akụrụngwa nke a nwere ike nyere gị aka nwetakwuo nhụmiihe ndị bara uru.

Ndị mmadụ n’otu n’otu na ndị Ezi na ụlọ N’Ebe obibi

Ebe kacha mma ịmụ ozi ọma bụ ebe obibi. Ndị nkuzi gị na nzukọ nsọ nwere ike kwadoo gị, ma i nwere ike nwete mgbam ume site na ndị òtù ngalaba ukwu ndị ọzọ. Mana ịnyandụ niime mmụọ, gị na ezi na ụlọ gị nwere mkpa ọzụzụ kwa ụbọchi site “n’okwu dị mma nke Chineke” (Moronaị 6:4; lee kwa Russell M. Nelson, “Okwu Mmalite,” Liahona, Nov. 2018, 6–8).

Jiri akụrụngwa nke a n’ụzọ ọbụla baara gị uru. Ntụpụta ndị a wepụtara ụfọdụ ezi okwu dị ebighị ebi ndị dị niime Agba Ochie. Ha nakwa atụpụta uche na ihe omume niile iji nyere unu aka mụọ akwụkwọ nsọ n’otu n’otu, gị na ezi na ụlọ gị, ma ọ bụ gị na ndị enyi. Dị ka ị na-amụ ihe, soro odudu nke Mmụọ ahụ iji chọta eziokwu ndị dị ebighị ebi nke bara uru nye gị. Chọọ ozi ndị Chineke nwere maka gị, ma soro nkwagide niile ị natara.

Ndị Nkuzi na Ndị Ọmụmụ ihe na Nzukọ nsọ

Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ bụ kurikulum maka klas Sọnde niile niime Praịmarị, ndị ntoroọbịa na Ụlọ akwụkwọ Sọnde ndị dimkpa, klas niile nke Ndịiyom Nta, na nzukọ niile nke kworum Ọkwa nchụaja nke Erọn. Ọ bụrụ na ị na-akuzi ihe na ntọ nke ọbụla na ndị a, a na-agba gị ume iji ntụpụta niile dị niime akụrụngwa nke a maka ọmụmụ ihe nke onwe gị na dị ka ị na-akwado ikuzi ihe. Bido site n’inwe nhụmiihe ndị nke onwe gị niime akwụkwọ nsọ. Nkwado gị nke kachasị dị mkpa ga-eme dị ka ị na-enyochagharị akwụkwọ nsọ ma chọọ mkpatemmụọ nke Mmụọ Nsọ. Chọọ eziokwu ebighị ebi niile na-enyere gị aka dịrị karịa ka Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist. Bịanụ, Soro M nwere ike inyere gị aka mata ụfọdụ eziokwu ndị a ma ghọta ọnọdụ nke akwụkwọ nsọ.

Buru n’uche na ọmụmụ ozi ọma, n’ụzọ ya kachasị mma, bụ nke gbadoro ụkwụ n’ebe obibi ma Nzukọ nsọ na-akwado. Na-ikwu ya n’ụzọ ọzọ, isi oke na ọrụ gị bụ ịkwado ndị ị na-akuziri ihe na mgbalị ha ịmụ ma bie ndụ ozi ọma n’ebe obibi. Enyela onwe gị nsogbu banyere inwe ọdịnaya pụrụ iche iji nye ha ihe niime klas. Kama, nye ha ohere niile iji kekọrịta nhụmiihe, echiche, na ajụjụ ha banyere edereede akwụkwọ nsọ ha gụworo n’ebe obibi. Kpọkuo ha ikesa eziokwu ebighị ebi ha chọtaworo. Nke a kacha mkpa karịa ịgụcha ọtụtụ edereede akpọrọ aha.

Klas Ụlọ akwụkwọ Sọnde nke Ndị Ntoroọbịa na Ndị Dimkpa.

Otu isi nzube nke na-eme anyị ji na-agbakọta na klas Ụlọ akwụkwọ Sọnde niile bụ iji kwadoo ma gbaa onye n’ibe ya ume dị ka anyị na-agbasi mbọ ike isoro Jizọs Kraịst. Otu ụzọ dị mfe ime nke a bụ ịjụ ajụjụ dị ka “Gịnị ka Mmụọ Nsọ kuziworo gị n’izu ụka nke a dị ka ịmụrụ akwụkwọ nsọ?” Azịza niile nye ajụjụ nke a nwere ike duba na mkparịta ụka bara uru nke na-ewulite okwukwe niime Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya.

Mgbe ahụ i nwere ike kpalite mkparịta ụka dabeere na ntụpụta ọmụmụ ihe ahụ dị niime Bịanụ, Soro M. Ịma atụ, echiche ọmụmụ ihe nwere ike tupụta inyochagharị Aịzaya 53, na-achọ maka mkpụrụokwu ndị ga-akọwa ozi nke Onye Nzọpụta. I nwere ike gwa ndị otù klas ikesa echiche ọbụla ma ọ bụ mmetụta ndị nke okwu ndị a kpatere maka ha. Ma ọ bụ i nwere ike tinye ezigbo oge na-achọ mkpụrụokwu ndị a dị ka òtù klas.

Kworum ndị nke Ọkwa Nchụaja Erọn na Klasị niile nke Ndịiyom Nta

Mgbe kworum niile nke Ọkwa Nchụaja Erọn na Klasị niile nke Ndịiyom Nta zukọtara na Sọnde niile, nzube ha dịtụ iche site na klas nke Ụlọ akwụkwọ Sọnde. Na mgbakwunye inyere onye n’ibe ya aka ịmụ ozi ọma nke Jizọs Kraịst, otù ndị a nakwa ezukọ ịdụrịkọta ọdụ banyere imejupụta ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu (lee Akwụkwọ ntuziaka Izugbe, 1.2). Ha na-eme nke a site na ntuziaka nke otù ndịisi klas na kworum.

Maka nzube nke a, kworum ọbụla ma ọ bụ nzukọ klas kwesịrị ịmalite site na onye otù nke otù ndịisi kworum ma ọ bụ klas na-edu mkparịta ụka banyere mbọ niile nke, iji maatụ, bie ndụ ozi ọma, lekọta ndị nọ na mkpa, kesaa ozi ọma, ma ọ bụ sonye n’ọrụ tempụl na agụgụala ezi na ụlọ.

Mgbe oge ndụkọrịta ọdụ nke a gasịrị, onye nkuzi na-edu klas ma ọ bụ kworum na-ịmụkọrịta ozi ọma ọnụ. Ndị ndu ndị dimkpa ma ọ bụ ndị òtù nke klas ma ọ bụ kworum ka enwere ike ikenye ikuzi ihe. Otù ndịisi klas ma ọ bụ kworum, na-ịjụta ndị ndu ndị dimkpa, na-abụ ndị na-eke ọrụ ndị a.

Ndị ekenyere ikuzi ihe kwesịrị ikwado site n’iji ntụnyeuche ọmụmụ ihe niile dị niime ntụpụta kwa izu ụka nke Bịanụ, Soro M. Niime ntụpụta nke ọbụla, akara ngosi nke a akara ngosi semịnarị na-egosipụta ihe omume nke dị mkpa nʻụzọ pụrụ iche nye ndị ntoroọbịa. Kosiladị, arọ ọbụla niime ntinyeuche ndị a edepụtara ka enwere ike iji mee ihe dị ka ihe omume ọmụmụ ihe maka ndị ntoroọbịa.

Maka ajenda ịmaatụ maka nzukọ kworum na klas, lee appendix D.

Praịmarị

Nkwado gị ikuziri ndị Praịmarị ihe na-ebido dị ka ị na-amụ akwụkwọ nsọ n’onwe gị na gị na ezi na ụlọ gị. Dị ka ị na-eme otu a, dịrị njikere ịnata mmetụta na nghọta nke ime mmụọ site n’aka Mmụọ Nsọ banyere ụmụ ntakịrị nọ niime klas Praịmarị gị. Na-ekpesi ekpere ike, ma Mmụọ ahụ nwere ike kpatee gị jiri nchepụta niile iji nyere ha aka mụta ozi ọma nke Jizọs Kraịst.

Dị ka ị na-akwado ikuzi ihe, i nwere ike nwetekwuo mkpatemmụọ ndị ọzọ site na-inyocha nchepụta nkuzi niile dị niime Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ. Ntụpụta nke ọbụla dị niime akụrụngwa nke a nwere nkeji a na-akpọ “Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị ihe.” Chee echiche maka nchepụta ndị a dị ka ntinyeuche ndị eji akpalite mkpatemmụọ gị. Ị maara ụmụntakịrị nọ niime klas Praịmarị gị—ma ị ga-abịa mata ha ọbụna karịa dị ka gị na ha na-akparịta ụka niime klas. Chineke makwa ha, ma Ọ ga-akpatemmụọ gị jiri ụzọ ndị kachasị mma iji kuziere ha ihe ma gọzie ha.

O kwere omume na ụmụntakịrị nọ niime klas gị nwere ike ha emeworịị ụfọdụ niime ihe omume ndị dị niime Bịanụ, Soro M ha na ezi na ụlọ ha. Nke ahụ Dị Mma. Kwu nkwugharị dị mma. Tulee ikpọku ụmụntakịrị ikesara ibe ha ihe ha mụrụ n’ebe obibi—agbanyeghị i kwesịkwara ịtụpụta ụzọ ndị nke ụmụntakịrị ga-esi esonye ọbụna ọ bụrụ na ha anaghị amụ ihe nʻebe obibi. Ụmụntakịrị na-amụ eziokwu niile nke ozi ọma n’ụzọ kacha baa uru mgbe a na-akuzi eziokwu ndị a ugboro ugboro site n’ihe omume dị iche iche. Ọ bụrụ ma ị chọta na otu ihe omume nke ọmụmụ ihe bara uru maka ụmụntakịrị, tulee imegharị ya, kachasị ọ bụrụ na ị na-akuziri ụmụntakịrị kacha obere. I nwekwara ike inyocha ihe omume site na ihe ọmụmụ nke gara aga.

Niime ọnwa ndị nwere Sọnde ise, ndị nkuzi Praịmarị ka a na-agba ume idochi nhazi Bịanụ, Soro M atụpụtara na Sọnde nke ise jiri otu ihe omume ma ọ bụ karịa dị niime “Appendix B: Maka Praịmarị—Ịkwado Ụmụntakịrị maka Oge ndụ n’Ụzọ Ọgbụgba ndụ nke Chineke.”