“Ịgọzi Ezi na ụlọ Niile nke Ụwa,” Liahona, Mar. 2026.
Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Maachị 2026
Ịgọzi Ezi na ụlọ Niile nke Ụwa
Ọ bụrụ na anyị soro ma kesaa atụmatụ nke Nna nke Eluigwe maka ezi na ụlọ niile, Ọ ga-anọnyere anyị, kwadoo anyị, ma sonyere anyị na njem anyị laghachikwuru Ya.
Nrọ nke Jekọb na Betel, site n’aka J. Ken Spencer
Na nso nso a, Nwanne nwanyị Uchtdorf na mụ gara baptizim nke otu nwa nwa nwa anyị. Dị ka anyị lere ka ọtụtụ ndudugandu n̄ụrịrị ọn̄ụ na mmemme nke a, anyị nwetere obi ekele miri emi nʻebe Nna nke Eluigwe nọ maka atụmatụ nke nzọpụta Ya maka ụmụ Ya. Anyị ghọtara otu ezi na ụlọ na ọgbụgba ndụ niile dị nsọ si dị mkpa nye Ya kemgbe isi mmalite.
Ịdị mkpa ahụ ka enwere ike ịhụ niime nkọwapụta Agba Ochie nke Jekọb kwesịrị ntụkwasị obi, onye mere njem ogologo na nke siri ezigbo ike ịchọta nwunye, mee ọlụlụ niime ọgbụgba ndụ, na hiwe ezi na ụlọ. Otu mgbede, Jekọb kwụsịrị izu ike abalị mana chọta naanị okwute maka ihe nhiwe isi ya. Ike gwụworo ya nke ukwuu niihi na ọ ka nwere ike ihi ụra—ma rọọ nrọ.
Jiri ebumnuuche ya tozuru oke nke ọgbụgba ndụ alụm di na nwunye na ezi na ụlọ nʻezie nobi ya, Jekọb hụrụ ubube guzoro nelu ala, ma elu ya ruru eluigwe: ma lee ndị mmụọ ozi nke Chineke na-agbago ma na-arịdata na ya.
“Ma, lee, Onyenwe anyị guzoro nelu ya, ma na-asị, A bụ M Onyenwe Chineke nke Ebraham nna gị, na Chineke nke Aizak” (Jenesis 28:12–13).
Onyenwe anyị emesịa kwee nkwa ọgbụgba ndụ ụfọdụ dị mkpa nye Jekọb—nkwa ndị O kwewooro nna nke Jekọb, Aịzik, na nna nna ya, Ebreham, tinyere:
-
Nkwa niile na Jekọb ga-abụ nna nke igwe mmadụ” (Jenesis 28:3; lee kwa amaokwu nke 14).
-
Nkwa nke ala maka ụmụ ụmụ nke Jekọb (lee Jenesis 28:4, 13).
-
Nkwa niile na site na Jekọb ma “mkpụrụ ya ka aga esi agọzi ezi na ụlọ niile nke ụwa agọzi” (Jenesis 28:14; nkwusi ike agbakwunyere)
Ụdị dị nsọ ka nhụmiihe nke Jekọb dịịrị nke mere na o kwuputara: “Nʻezie Onyenwe anyị nọ nʻebe a. … Nke abụghị ihe ọbụla ọzọ kama ụlọ nke Chineke, ma nke a bụ ọnụ ụzọ ama nke eluigwe” (Jenesis 28:16–17). Ma otu a, Jekọb kpọrọ mpaghara ebe ahụ Bet-el, nke pụtara “ụlọ nke Chineke” (Jenesis 28:19, nkọwaada a).
Ngọzi niile ekwere na nkwa enyere niime nrọ nke Jekọb na-achọ ka Jekọb mee ụfọdụ ihe ndị atụ nke ịrị elu nʻezigbo ndụ. Dị ka Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a, ọ raghị ahụ ịhụta njikọ nʻetiti nrọ nke Jekọb, ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị, na ụlọ nke Onyenwe anyị. Tempụl niile dịkarịsịrị ka ubube Jekọb hụrụ. Nkuzi niile, emume nsọ niile, na ọgbụgba ndụ niile nke ụlọ nke Onyenwe anyị na-ejikọ eluigwe na ụwa. Ọgbụgba ndụ niile ka enwere ike ịtụnyere ebe nzọụkwụ niile nke ubube nke na-adọta anyị nso rute Onyenwe anyị nọ. Ma, site nʻije ozi dị nsọ anyị na-enye niime tempụl niile dị nsọ, anyị na-agọzi “ezi na ụlọ niile nke ụwa”—ndị gara aga, ndị ugbu a, na ndị na-abịa niihu.
Ụdị Nchọpụta!”
Okenye Bruce C. Hafen, emeritus onye otu nke Ndị Iri Asaa, otu mgbe natara oku ekwe ntị sitere na odee nke magazin ọkwa zuru mba. Odee ahụ na-achọ ikwu banyere otu akwụkwọ na nso nso a nke nyochagharịrị agụgụala nke nkwenye niile banyere eluigwe netiti okpukperechi dị iche iche.
“Ndị odee chọpụtara na ndị ọha na-enwe agụụ zuru ụwa maka eluigwe—ma ezi na ụlọ niile neluigwe,”Okenye Hafen dere. Mana ebe ndị kacha niime anyị ka kwere na ndụ mgbe ọnwụ gasịrị, ịhụnaanya ebighị ebi, na nchikota niile nke ezi na ụlọ nke eluigwe, “ọtụtụ nzukọ nsọ Ndị Kristian na-enye obere azịza nye agụụ nke ime mmụọ nke a”—jiri otu ngụpụ: Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a.
Niime Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta eweghachitere, anyị nwere tempụl ndị dị nsọ. Anyị nwere alụm di na nwunye dị ebighị ebi, jiri ikikere ọkwa nchụaja nke na-agọzi gafee ọnwụ anụ ahụ. Anyị nwere nkwa nke ọdịniihu ebighị ebi anyị na ndị anyị hụrụ naanya nihu nke Nna na Ọkpara. Nyere ihe a niile, ndị odee chịkọtara na echcihe eluigwe nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a bụ nke kachasị zuo—ma, aga m agbakwunye, nke kacha nʻobi ụtọ.
“Ụdị nchọpụta!” Okenye Hafen matara. Ọtụtụ ndị mmadụ taa na-enwe agụụ maka ezi na ụlọ dị ebighị ebi, ma [ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere] mejupụtara agụụ ahụ nke ọma karịa otu n ndị ọzọ ama ama si chee [ma ọ bụ nkwenye nke okpukpere chi niile]. Ọ na-adị m ka ụwa niile nwere ike ịnụ ụmụ anyị na-agụ ozi ọma ahụ: ʻEzi na ụlọ nwere ike ịnọkọta ọnụ.ʻ”
Ezi na ụlọ niile abụghị nnọọ nkwekọrịta ihu ọha dabara adaba. Ha bụ usoro ebighị ebi nke eluigwe. Ha bụ “ihe dị n’etiti atụmatụ nke Onye Okike maka akaraka ebighi ebi nke ụmụ Ya niile.” Dị ka Onyeisi Russell M. Nelson (1924–2025) kuziiri anyị: [Onyenwe anyị] kere ụwa [ka] anyị wee rite anụ ahụ ma hazie ezi na ụlọ. O hiwere Nzukọ nsọ Ya iji bulie ezi na ụlọ niile. Ọ na-enye tempụl niile ka ezi na ụlọ niile nwee ike nọrọkọta ọnụ ruo ebighị ebi.”
Mana ọchịchọ anyị niime ezi na ụlọ siri ike abụghị nnọọ banyere akara aka ebighị ebi niile. Ezi na ụlọ na-arụ ọrụ dị oke mkpa niime obi ụtọ nke ndụ anụ ahụ anyị kwa. Nna nke Eluigwe anyị, onye maara nozuzu oke ihe na-ewete obi ụtọ ugbu a na mgbe ebighị ebi, na-ezite ụmụ Ya nye ezi na ụlọ—ezughị oke dị ka ha nwere ike ịdị—ma kpọkuo anyị iwulite na ịzụlite ezi na ụlọ siri ike. Nʻezie, nkwarụ ahụ, ọnwụ, ma ọ bụ ọnọdụ niile ndị ọzọ nwere ike ime ka e nwee mkpa nnọzigharị nke onwe.” Mana ọdịghị ihe nwere ike ịnọchi oke na ọrụ enyere dị mkpa, si na chi, nke di na nwunye, nna na nne.
Nnyochagharị nke “ndụ ezi na ụlọ nne na nna abụọ, ejikọtara” na-aganiihu igosịpụta na ezi na ụlọ dị mkpa nichekwa “njikọ niile nke ịhụnaanya na mmetụta miri emi.” Ọ bụ “isi nkubetọ maka ndị mmadụ ụkwụ siri ike nʻala, haziri onwe ha, ma mara ihe nihu ọha.”
Ndị Nchedo nke Ezi na ụlọ Na-arụsi ọrụ ike
Nʻezie, o kwesịghị ịtụ anyị naanya na ihe dị oke mkpa nye atụmatụ nke Chineke ga-ezute mmegide. Ọ dịbeghị mgbe Setan mere ezi na ụlọ enyi, ma mbọ ya niile na-adịrịwo ngwa ngwa “niihi na ọ maara na o nwere naanị nwa obere oge” (Mkpughe 12:12). Dị ka Onyeisi M. Russell Ballard (1928–2023), Onyeisi Nnọchịte Kworum nke Ndịozi Iri na Abụọ, kwuru, “Setan maara na ụzọ doro anya na nke kachasị dị irè iji mebie ọrụ nke Onyenwe anyị bụ ibelata ịdị irè nke ezi na ụlọ na ịdị nsọ nke ebe obibi.”
Ịmara ihe anyị maara banyere ezi na ụlọ ebighị ebi nke Chineke, atụmatụ Ya maka ụmụ Ya, na uru mmekọrịta ebighị ebi nke ezi na ụlọ, anyị kwesịrị ịnọ netiti ndị nchedo kachasị arụsi ọrụ ike nke ezi na ụlọ.
Kedụ otu anyị ga-esi eme nke a?
Onyeisi Dallin H. Oaks nyere ndụmọdụ nke a: “Ọkwa a maara ezi na ụlọ … bụ nkwugharịsi ike nke eziokwu niile ozi ọma anyị nwere mkpa iji kwadoo anyị site aka mgba nke ugbu a niile nye ezi na ụlọ.”
Niime ndụ nke onwe anyị, anyị pụrụ ime “obere ihe na ihe niile dị mfe” (Alma 37:6) nke na-agba mmekọrịta ezi na ụlọ ume. Nke a gụnyere isoro ụkpụrụ niile nke ezi na ụlọ na alụm di na nwunye ndị na-eme nke ọma edepụtara niime ọkwa a maara ezi na ụlọ: “okwukwe, ekpere, nchegharị, mgbaghara, nkwanye ugwu, ịhụnaanya, ọmịiko, na ihe omume ezumiike niile nʻedozi ahụ.” Na-agbanyeghị ọnọdụ ezi na ụlọ anyị ugbu a, anyị nwere ike gosị site nʻomume anyị na mmekọrịta ezi na ụlọ dị anyị mkpa ruo ebighị ebi.
Dị ka “ụmụ amaala nwere oke na ọrụ” niime obodo anyị, anyị nwere ike “ịkwalite atụ ndị ahụ emebere iji jikwata ma gbaa ezi na ụlọ ume.”
Anyị bụ ndị ọgbụgba ndụ ụbọchị ilpeazụ nke Onyenwe anyị. Anyị bụ ndị nketa nke nkwa niile ekwere Ebreham, Aịzik, na Jekọb—nkwa niile nke nwere ihe niile ha na ezi na ụlọ ime. Nkwa ndị ahụ na-eji oku dị nsọ abịa iji gọzie “ezi na ụlọ niile nke ụwa.” Ma otu ụzọ dị mkpa anyị si eme nke ahụ bụ site nibi ndụ, ichedo, na ikesa eziokwu ebighị ebi ahụ na “ezi na ụlọ ka Chineke kwadoro” ma na “emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile dị adị niime tempụl nsọ niile iji mee ya ekwe omume maka ndị mmadụ ịlaghachi nihu Chineke na maka ijikọta ezi na ụlọ niile ruo ebighị ebi.”
“A nọnyeere M Gị”
Mgbe Nwanne nwanyị Uchtdorf na m na-ahụ ndị otu ezi na ụlọ anyị ka ha na-eme ọgbụgba ndụ niile dị nsọ ha na Nna nke Eluigwe anyị, obi anyị na-ejuputa nʻọn̄ụ na obi ekele. Anyị na-an̄ụrị ọbụghị naanị na ụmụ anyị na ụmụ ha mana nakwa ndị nne na nna anyị na ndị nne na nna ha. Anyị na-atule uche jiri ịhụnaanya dị omimi otu ọgbụgba ndụ niile nke ozi ọma si ejikọ anyị gafee ọtụtụ ndudugandu. Ọ bụ nhụmiihe na-abụghị dị ka ịhụ “ubube guzoro nelu ala, … elu ya [na-eru] eluigwe: ma lee ndị mmụọ ozi nke Chineke na-agbago ma na-arịdata na ya” (Jenesis 28:12).
Ngọzi niile Onyenwe anyị kwere nkwa nye Jekọb niime nrọ ya setịpụrụ ruo ụmụ ọgbụgba ndụ Ya niile—gụnyere mụ na gị. Dị ka Onyenwe anyị meere Jekọb, Ọ ga-aza anyị “nʻụbọchị nsogbu [anyị]” (Jenesis 35:3)
“Lee,” ka Onyenwe anyị kwuru, “A nọnyeere M gị, ma ga-edebe gị nʻebe niile nke ị na-aga, … niihi na agaghị ahapụ gị” (Jenesis 28:15).
Dị ka Jekọb, anyị niile nwere alaịkpa nke anyị ga-agafe. Mgbe ụfọdụ ngọzi niile ekwere nkwa na-eyi ihe dị anya. Mgbe nsogbu ndị siri ike ma ọ bụ akamgba niile na-abịa, anyị nwere ike na-ajụ maka ịhụnaanya nke Onyenwe anyị. Anyị nwekwara ike na-eche na Chineke echefuwo anyị. Na-agbanyeghị mbọ anyị kacha mma nke iso ụzọ, anyị nwere ike na-eche na anyị anaghị anata ngọzi niile anyị na-atụanya maka ya.
Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ezi ndị enyi, ụzọ ọgbụgba ndụ bụ ụzọ na-enye ọn̄ụ, na-agbanyeghị mgbe ụfọdụ o nwere ike juputa nʻanya mmiri. Ọ bụrụ na gị na-eche na emejuputaghị akụkụ niile nke atụmatụ obi ụtọ niime ndụ gị ugbu a, biko tụkwasị obi na Onyenwe anyị bu gị nuche ma ga-agọzi gị noge Ya akara aka, dị ka otu amamiihe Ya siri dị.
Okwukwe niime Jizọs Kraịst na nkwa Ya niile na-akpatemmụọ anyị ile anya niihu, ọbụghị ile anya na-azụ. Niihi Ya, ọdịniihu anyị anaghị achọ ka ejigide ya na ndọkpụ nʻagha site nʻaka ihe ọbụla nke meworo nʻoge gara aga ma ọ bụ na-anọchiri anyị ụzọ ugbu a. Ee, emerụrụ anyị niile ahụ, ma ọ bụ aga, emerụ anyị niile ahụ nʻotu ụzọ ma ọ bụ nke ọzọ. Mana anyị kwere niime Nnukwu Ọgwọọ Ọrịa. Anyị tụkwasịrị obi na Ya—nke ukwuu, nʻezie, na anyị na-anabata nkwa Ya niile, nʻuju “ka ha na-akwagide,” ọbụna mgbe ha ka nọ “ebe dị anya” (Ndị Hibru 11:13).
“Ka echetere anyị na, n’ụzọ ma n’oge nke Onyenwe anyị, agaghị ejichi ngọzi ọbụla site nʻebe Ndị Nsọ Ya kwụsịrị ntụkwasị obi nọ,” ka Onyeisi Nelson kwuru. “Onyenwe anyị ga-ekpe ikpe ma kwụọ onye ọbụla ụgwọ dịka otu ọchịchọ obi onye ahụ sịrị dị ma ịhe ọ metara.”
Ana m ekwe nkwa na ọ bụrụ na anyị soro ma kesaa atụmatụ nke Nna nke Eluigwe maka ezi na ụlọ niile, Ọ ga-anọnyere anyị, kwadoo anyị, ma sonyere anyị na njem anyị. O nweghị ike ahapụ anyị naanị anyị, kacha nke mgbe mnwale niile na-abịakwute anyị ma ọ bụ bịara ndị anyị hụrụ naanya. Ọ ga-eburu anyị, bulie anyị elu, ma kpọta anyị nala nke ekwere na nkwa nke uju nke ọn̄ụ anyị na Ya, na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, na anyị na ezi na ụlọ anyị—ruo ebighị ebi.
© 2026 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Liahona Kwa ọnwa, Maachị 2026. Igbo. 19937 593