2025
Nna nke Eluigwe Chọrọ Ikwuuru Gị Okwu
Maachị 2025


“Nna nke Eluigwe Chọrọ Ikwuuru Gị Okwu,” Liahona, Maachị 2025.

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Maachị 2025

Nna nke Eluigwe Chọrọ Ikwuuru Gị Okwu

Ka okwukwe ịnwere na Nna nke Eluigwe na Ọkpara Ya Ọ Hụrụ naanya nyere gị aka meghe akwa mgbochi ahụ ma nụrụ olu nke Nna.

onye inyom nta na-ekpe ekpere

Anyị bụ ụmụ ndị nwoke na ndị nwanyị nke Chineke, na-ebikọrịta ọnụ nʻụwa dị ezigbo anya site nʻebe obibi anyị nke igwe. Nke a bụ ndụ anụ ahụ anyị, oge iji nata anụ ahụ, họrọ ezi ihe ma hapụ ajọọ ihe, “na-edetụkwa ihe ilu ahụ ire, ka [anyị] wee mara ikwe ọnụ ahịa ezi ihe” (Mosis 6:55), zulite okwukwe anyị na Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst na aja mgbaghara mmehie Ya dị nsọ, ma nabata atụmatụ obi ụtọ nke Nna anyị. Anyị nọ nʻebe a ịdịtụkwu ka Nna anyị nke Eluigwe.

Nihi anyị echefuwo ndụ tupu ndụ anụ ahụ anyị, anyị, mgbe ụfọdụ, na-enwe owu ọmụma maka ụwa ahụ nke anyị hapụrụ nʻazụ. Nna anyị enyewo anyị onyinye nke ime mmụọ iji nwee njikọ anyị na Ya ma nata odudu, ntuzi aka, na nkasị obi site nʻaka Ya. Anyị mara onyinye nke a ọfụma; a na-akpọ ya ekpere.

Kpeere Nna Gị nke Eluigwe Ekpere.

Maka Adam na Iv na ndị niile ga-esoro ha, onye mmụọ ozi nyere ntuziaka, “Ị ga-echegharị ma kpọkuo Chineke n’aha nke Ọkpara ahụ ruo mgbe nile karịa” (Mosis 5:8).

Jizọs kuziri: “Na-arịọnụ, a ga-enye unu, na-achọnụ, unu ga-achọta; na-akụnụ, a ga-emeghere unu” (Matiu 7:7). “Mgbe ọbụla unu kpere ekpere, … kpee ekpere nye Nna unu … na nzuzo” (Matiu 6:6). “Ya mere n’ụdị usoro nke a na-ekpenu ekpere: Nna anyị nke bi n’elu-igwe, ka e doo aha Gị nsọ” (Matiu 6:9).

Jizọs kpere ekpere nye Nna Ya esepụghị aka. “Ọ rigoro nʻelu ugwu ahụ ịkpe ekpere, ma Ọ wee nọgide nʻogologo abalị ahụ nʻịkpe ekpere nye Chineke” (Luk 6:12). “Ma … ọ jere nʻugwu ahụ ịkpe ekpere” (Mak 6:46). “Ma ha wee bịaruo ogige nke aha ya bụ Getsemani: ma ọ wee sị ndị na-eso ụzọ ya, nọdụnụ ebe a, mgbe m na-ekpe ekpere” (Mak 14:32). Mgbe ọ nọ nelu obe ahụ, Jizọs kpere ekpere maka ndị ahụ kpọgidere ya nobe: “Nna, gbaghara ha; niihi na ha amaghị ihe ha na-eme.” (Luk 23:34).

Akwụkwọ nsọ na-enye ndụmọdụ kʻanyị na “ekpe ekpere oge niile” (Luk 21:36; 2 Nifaị 32:9; 3 Nifaị 18:15; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10:5; 19:38; 20:33; 31:12). “Nata ndụmọdụ n’aka Onyenwe anyị n’ihe niile ị na-eme, ma ọ ga-eduzi gị na mma” (Alma 37:37). Na mgbakwụnye, anyị na “enye ekele nile na otuto nke mkpụrụ obi [anyị] nwere ike inwe” (Mozaya 2:20), wee na-amata ihe niile nke Nna anyị meworo maka anyị.

Onyeisi Russell M. Nelson kọwara: “Ugwu onwe nke ime mmụọ na-amalite site na mmata ihe na ụtụtụ ọbụla bụ onyinye sitere na Chineke. … Ọ na-echekwa anyị site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị, ma na-akwado anyị site n’otu nwa oge nta ruo na nke ọzọ (lee Mozaya 2:21).”

Nifaị kwuru sị “Ọbụrụ na unu ga-an̄a ntị n’olu Mmụọ ahụ nke na-akụziri mmadụ ikpe ekpere, unu ga-amata na unu ga-ekperiri ekpere; n’ihi na mụọ ọjọọ anaghị akụziri mmadụ ikpe ekpere, kama ọ na-akụziri ya na o kwesịghị ka o kpee ekpere ma ọlị” (2 Nifaị 32:8).

eserese akụku ihe nke Onye Nzọpụta

Nkọwa sitere na Kraịst na-akpọlite Nwa nwanyị nke Jarus, site n’aka Greg K. Olsen

Nihi ọmụmatụ nke Onye Nzọpụta anyị na ndụmọdụ nke ndị mmụọ ozi na ndị amụma kemgbe ọtụtụ narị afọ, anyị maara nke ọma ikpe ekpere kwa ụbọchị iji gosi obi ekele maka ngọzi niile, na idebe ekpere niime obi anyị oge niile. Anyị nwere oke nʻọrụ ịkwurịtara anyị na Nna anyị okwu.

Mana ọbụna nke kacha dị ebube, Nna anyị nke Eluigwe na-azaghachi ekpere anyị niile. Ajụjụ a na-echere echiche n’ime ụwa anụ ahụ nke a bụ, kedu ụzọ katụ mma anyị ga-esi nata ma ghọta azịza niile, ntụzịaka na nkasi obi na-abịa site n’aka Nna anyị?

N’ime ihe karịrị afọ iri asaa nke ndụ m, amaara m na Nna anyị na-agwa anyị okwu. Anyị anọghị naanị anyị. Ndị eluigwe na-eche anyị nche ma na-enyere anyị aka dị ka anyị na-achọ isoro Onye nzọpụta.

Ịnata azịza nke ekpere anyị na-amalite site n’okwukwe anyị na Nna anyị nke Eluigwe na n’ime Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst. Jizọs kwuru “Unu atụkwala ụjọ, naanị kwere” (Mak 5:36). Anyị tụkwasịrị obi na Ya, na-eme ike anyị iji debe iwu nsọ niile, ma na-achọ aka Ya niime ihe niile. “Ma onweghị ihe mmadụ ji emehie Chineke … m’ọbụghị ndị ahụ ndị na-anaghị ekwuputa aka ọrụ ya n’ihe nile, ma na-anaghị erube isi n’iwu nsọ ya nile” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 59:21).

Aka Chineke niime ndụ anyị apụtaghị na ọ bụ Ya na-eme ajọọ ihe na ọdachi dị egwu ndị na-eme nʻụwa anyị. Otu ọ dị, nke ahụ pụtara na nʻoge niile nke ihe isiike na ezighi ezi gị, Ọ ga-akwụrụ nʻakụkụ gị, gbaa ike gị niile ume, kasie gị obi, ma “doo mkpagbu gị niile nsọ ka ha bụrụ uru gị” (2 Nifaị 2:2).

Nụrụ Olu Ya

Dị ka anyị na-enwe okwukwe na Ya ma debe iwu nsọ Ya niile, ọ ga aka adịkwuru anyị mfe ịmụta ịnụ olu Ya.

Na Septemba afọ 1993, afọ nke mbụ m dị ka Onye Ji Ikike Zuru ọha, Onyeisi James E. Faust (1920–2007), mgbe ahụ onye otù Kworum nke Ndịozi Iri na Abụọ, kpọrọ mụ na nwunye m Kathy, ka anyị soro ya jee otu ofufe nro nke Mahadum Brigham Young. Cheta, afọ 1993 bụ tupu e nwee igwe ekwentị mara ihe, soshial midiya, na ịntanetị zuru ebe niile.

N’okwu ya, akpọrọ “Olu nke Mmụọ ahụ,” Onyeisi Faust dọrọ aka na ntị: “Na ndudugandu unu, ọtụtụ olu ga-ejuputa na ntị unu na-agwa unu otu esi ebi ndụ, otu esi emeju agụụ gị, otu esi enweta ihe niile. Unu ga-enwe telivishọn chanel ruru narị ise na mkpịsị aka unu. A ga-enwe ụdị sọftụwia niile, modem kọmputa na-emekọrịta ihe, ọba data, na bọọdụ mgbasa ozi; a ga-enwe mbipụta desktọpụ, ihe ndị na-anata satịlaịtị, na netwọkụ nkwukọrịta ndị ga-eme ka ị ghara ikute ume nihi ozi dị imerime. … Olu nke ị ga-amụtarịrị ịge ntị bụ olu nke Mmụọ ahụ.”

Onyeisi Boyd K. Packer (1924–2015), Onyeisi nke Kworum nke Ndịozi Iri na Abụọ, kuziri maka olu nke Mmụọ ahụ dị duu, dị obere nʻoge ịkọgharị nhụmiihe nke John Burroughs, mmadụ eke, dị ka ya na ndị enyi ya na-aga ije site na otu ogige igwe mmadụ juru. Nke a bụ okwu Onyeisi Packer:

“Karịa ụda niile nke ndụ obodo ukwu [Mazị Burroughs] nụrụ ukwe otu nnụnụ.

“Ọ kwụsịrị ma gee ntị! Ndị ya na ha nọ anụbeghị ya. O lere anya gburugburu. Ọ dịghị onye ọzọ hụrụ ya.

“O wutere ya na onye ọ bụla agaghị enwete ohere ịnụ ihe nke a mara mma.

“O wepụtara otu mkpụrụ ego site n’akpa ya tụlie ya elu. O kụrụ na akwa mgbe ahụ daa ụda, ọ daghịkwa ụda karịa ukwe nnụnụ ahụ. Onye ọ bụla tụgharịrị; ha nwere ike ịnụ nke ahụ!

“O siri ike ikewapụ ụda okporo ụzọ obodo ahụ site na ukwe otu nnụnụ. Mana i nwere ike ịnụ ya. Ị nwere ike ịnụ ya nke ọma ma ọ bụrụ na ị zụlitere onwe gị ka ị gee ya ntị.”

Nkuzi nke Mmụọ Nsọ nke Onyeisi Packer mere na 1979, oge mgbe ndụ dị jụụ karịa ma mkpọtụ nke ụwa ka emere ka obelata karịa ka ọ dị ugbu a.

Onyeisi Nelson kuziri, “Ọ bụrụ na ị na aka etinye uche gị niime ndepụta niile sitere na soshial midiya karịa ka ị na-etinye na ntaka niile nke Mmụọ, mgbe ahụ ị na-etinye onwe gị n’ihe egwu nke mmụọ.”

Onyeisi Faust kwuru, “Ọ bụrụ na anyị ga-ege ntị n’olu nke Mmụọ ahụ, anyị onwe anyị kwa ga-emegherịrị ntị anyị, tụgharịa anya nke okwukwe ruo na nsipụta nke olu ahụ, ma legidesie anya ike n’eluigwe.”

Olu nke Mmụọ ahụ a na-abịakwute ma ọgụgụ isi anyị na mmetụta anyị. “Aga m agwa gị n’ime uche gị ma n’ime obi gị, site na Mmụọ Nsọ, nke ga-adakwasị gị na nke ga-ebikwa n’ime obi gị” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 8:2). Gee akọnuche gị ntị—mkpughe ọtụtụ mgbe na-amalitekarị site nʻebe ahụ.

Okenye Andersen na-agwa otu ìgwè mmadụ okwu

N’oge nleta Girls’ Home Boys’ Town Complex na Obodo ukwu Markina, Philippines, na Febrụarị 2024, Okenye Andersen kuziiri ndị na-eto eto na ha bụ ụmụ Chineke: “Ọ hụrụ unu n’anya. Ma unu nwere ike ịrịọ Ya arịrịọ. Ọ ga-anụ ekpere unu.”

Jiri Obi Kwere ekwe Kpee ekpere

Enweghị ike ịmanye azịza na mmetụta. Anyị na-ekpe ekpere ma anyị echere jiri obi dị nnakwere. Ụfọdụ azịza agaghị abịa na ndụ nke a, mana nye ndị ezi omume, Onyenwe anyị ga-ezite udo Ya mgbe nile (lee Jọn 14:27). Azịza na-abịakarị mgbe anyị na-ekpe ekpere iji nyere ndị nọ anyị gburugburu aka. Mgbe ụfọdụ, ha na-abịa “ahịrị n’elu ahịrị, ụkpụrụ n’elu ụkpụrụ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 98:12).

Olu nke eluigwe nwere ike ịbịakwute anyị n’oge a na-atụghị anya ya na n’ebe ndị a na-atụghị anya ya, mana anyị na-achọta ohere anyị ndị kachasị mma nʻoghere ndị ahụ dị jụụ na nʻebe ndị dị nsọ. N’ịda jụụ nke ekpere ụtụtụ na ntụgharị uche m, a na m ahụta ngọzi ndị pụrụ iche. Ịgụ akwụkwọ nsọ nke onwe, kwa ụbọchị, na-enweghị mgbochi, nagbanyeghi ime ya oge akara aka, na-ebute olu nke Mmụọ niime obi anyị dị ka ọkụ nʻoge ndị ọzọ.

Mgbe ụfọdụ, mmetụta ndị ahụ na-esite kpọmkwem n’ihe anyị na-agụ, ma n’oge ndị ọzọkwa, ihe anyị na-atụgharị nʻuche na-eweta azịza nye nchegbu dị nnọọ iche nke a maara amara. Cheta okwu niile nke Okenye Robert D. Hales: “Mgbe anyị chọrọ ịgwa Chineke okwu, anyị na-ekpe ekpere. Ma mgbe anyị chọrọ ka Ọ gwa anyị okwu, anyị na-enyocha akwụkwọ nsọ.”

Dị ka mkpọtụ na ihe ndọpụ uche nke ụwa na-agba anyị gburugburu, Onyenwe anyị enyewo onye amụma Ya ntuzi aka ka o wukwo ọtụtụ tempụl. N’ime ụlọ ndị a dị nsọ nke Onyenwe anyị, dị ka anyị na-ahapụ ihe ịma aka anyị n’ezi ma jiri ekpere na nchegbu anyị banye, a na-akụziri anyị eziokwu nke ebighi ebi.

Otu afọ gara aga, Onyeisi Nelson kwere anyị nkwa nke a dị ịrịba ama: “Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, nke a bụ nkwa m. Enweghi ihe ga-aka enyere unu aka karịa ijigidesi okporo igwe ahụ aka ike karịa ife ofufe niime tempụl kwa mgbe kwa mgbe dị ka otu ọnọdụ niile unu si ekwe unu. Enweghị ihe ga-aka echekwa unu dị ka unu na-ezute ijiriji ọchịchịrị nke ụwa. Enweghi ihe ga-ebuli ịgba ama unu banyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya ma ọ bụ nyere unu aka ghọta atụmatụ magburu onwe ya nke Chineke karịa. Enweghị ihe ga-akacha eme ka mmụọ unu dajụọ n’oge niile nke mgbu. Enweghi ihe ga- emepe eluigwe niile karịa. Enweghi!

Ọgbakọ zuru ọha ọ bụla na-eweta ngọzi bara ụba agbakwunyere. Nʻọnwa Eprel na-abịa abịa, ọzọkwa, anyị ga-ezute nʻọgbakọ zuru ọha ịnụ olu nke Onyenwe anyị. Anyị na-abịa na ọgbakọ zuru ọha ebe anyị na-ekpewo ekpere ma kwadobe. Maka onye ọ bụla n’ime anyị, enwere nchegbu ndị na-enye oke nsogbu na ajụjụ ndị si anyị nʻobi. Anyị na-abịa ime ka okwukwe anyị dị ọhụrụ na Onye Nzọpụta anyị Jizọs Kraịst, ma gbaa ikikere anyị ume iji guzogide ọnwụnwa. Anyị na-abịa ka-akụziere anyị ihe site n’ebe dị elu. Ana m ekwe gị nkwa na dị ka ị na-akwado ma jiri ekpere na-abịa nzukọ niile nke ọgbakọ zuru ọha, ị ga-enweta azịza nye nchegbu gị niile, ma ị ga-amata na “aka eluigwe” dị n’isi gị.

Nwee okwukwe na Nna gị nke Eluigwe na-agwa gị okwu. Ọ na-eme ya! Kwe ka okwukwe ịnwere na Ya na Ọkpara Ya Ọ Hụrụ naanya nyere gị aka meghe akwa mgbochi ahụ ma nụrụ olu nke Nna gị. Ana m agba ama na Ọ nọ ebe ahụ ma hụ unu naanya karịa otu ọnụ nwere ike ikwu.

Hụba ama

  1. Russell M. Nelson, “Ọn̄ụ Na-abịa nʻỤtụtụ,” Ensign, Nọv. 1986, 68.

  2. Jeffrey R. Holland, “Olu nke Mmụọ ahụ” (Ofufe nro nke Mahadum Brigham Young, Sept. 5, 1993), 2, speeches.byu.edu

  3. Boyd K. Packer, “Ekpere na Azịza niile,” Ensign, Me. 1979, 19.

  4. Russell M. Nelson na Wendy W. Nelson, “Olileanya nke Izrel” (ofufe nro zuru ụwa nke ndị ntoroọbịa, June 3, 2018), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  5. James E. Faust, “Olu nke Mmụọ ahụ,” 4.

  6. Russell M. Nelson, “Akwụkwọ nsọ Dị nsọ: Ike nke Chineke nye Nzọpụta Anyị,” Liahona,, Me 2006, 26-27.

  7. Russell M. Nelson, “Nụrịa ọńụ niime Onyinye nke Ntụghe niile nke Ọkwa nchụaja,” Liahona, Me 2024, 122.

  8. Lee Neil L. Andersen, “Olu nke Onyenwe anyị,” Liahona, Nov. 2017, 126.