“Oriri nsọ Mbụ Ahụ,” Friend, Jun 2023, 46–47.
Ozi niile nke Friend Kwa ọnwa, Jun 2023
Akụkọ niile dị na Akwụkwọ nsọ
Oriri nsọ Mbụ Ahụ
Ngosipụta niile site n’aka Apryl Stott
Tupu Ya a nwụọ, Jizọs Kraịst na Ndị ozi Ya zukọtara. O nyere ha oriri nsọ.
Jizọs yawara achicha ma were ya nye ha. Ọ gwara ha rie ya iji nyere ha aka cheta na O nyere ndụ Ya niihi ha.
Emesịa Jizọs nyere ha otu iko. Ọ gwara ha ńụọ site na ya. Ọ ga-enyere ha aka chetakwa Ya.
Ọbụna mgbe Jizọs na-esoghị Ndị ozi Ya gasịrị, oriri nsọ nyeere ha aka iche echiche banyere Ya. Anyị nwere ike nwee mmetụtụ ịhụnaanya Ya ma cheta idebe iwu nsọ niile.
Ihuakwụkwọ a na-ete agba
E nwere M ike Iri Oriri nsọ
Ngosipụta site n’aka Apryl Stott
Mgbe m na-eri oriri nsọ, e nwere m ike icheta Jizọs na ịhụnaanya O nwere n’ebe m nọ.
© 2023 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa Ọnwa, Jun 2023. Language. 19026 593