Ụmụntakịrị
Nchegharị bụ Onyinye
Onyinye nke nchegharị abụghị onyinye nke a na-ahụ anya m’ọbụ nke a na-akpasa aka. Kama, ọ bụ onyinye nke nwere ike ị metụta n’obi gị. Nke-a pụtara na mgbe anyị mere ajọọ nhọrọ, anyị nwere ike ịchegharị ma nwete udo na añụrị ọzọ.
Nna bi N’igwe na Jisọs Kraịst g’enyere anyị aka mgbe nile ị chegharị. Séé ịhe osise nke n’egosipụta ụsoro nile n’otu n’otu nke eji echegharị.
Anyị g’enwe mwute n’obi.
Anyị g’ekpere Nna Bi N’igwe ekpere, gwa Ya ịhe merenụ, ma rịọ enyemaka Ya maka ị họrọ ezị nhọrọ mgbe ọzọ.
Anyị arịọ mgbaghara ma gba mbọ ị mee ka ọ dị nma karịa.
Anyị enwetezie udo ma mara na agbagharawo anyị mmehie.