Ozi Nkuzi nke ndị-nleta ụmụnwanyị, Ọnwa anọ 2014
Ije Ozi-Chi nke Jisọs Kraịst: Onye-Nzọpụta na Onye-Mgbapụta
Jiri obi-ekpere gụọ akwụkwọ nkea, ma chọọ ka ịmata ịhe ị ga-akuzi ị ga-akuzi. Kedụ ka nghọta ndụ na ọrụ nke Onye Nzọpụta ga-esi wulite okwukwe gị ebe Ọ nọ, ma gọzie-kwa ndị ị na-elekọta site na ozi nkuzi-nleta ụmụnwanyị? Maka ịnweta nkọwa ndị-ọzọ, gaa na reliefsociety.lds.org.
Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enyem-aka
Otu n’ime ọtụtụ echichi nke eji akọwa Jisọs Kraist bụ Onye mgbapụta,” ka Okenye D. Todd Christofferson nke ndi ozi iri na abụọ kwuru. Mgbapụta pụtara imejupụta nkwa ma ọ bụ ịkwụ ụgwọ eji. Mgbapụta nwere ike ịpụta ịzọpụta ma ọ bụ ịgbahapụ dika ịkwụ ụgwọ nwere-onwe. … Ngosipụta ndịa nile na akọwa mpaghara dị ịche-iche nke ọrụ mgbapụta ahụ nke Jisọs Kraist mere site na Aja-mmehie Ya, nke sonyere, dịka akwụkwọ nke ọkọwa okwu kwuru, ‘ịzọpụta site na njọọ na ntamahụhụ ya nile, dịka site na ịchụ-aja maka onye-ome-njọọ.1
Linda K. Burton,Onye isi nduzi nke ndi otuu enyem aka, siri, Nna anyi nke elu-igwe … zitere Ọkpara Ya ọmụrụ nani ya, ezigbo Nwa ka ọbịa taa ahụhụ maka njọọ anyi nile, ịsị-ọwụwa anyi nile, ya ihe nile na adighi mma na ndụ anyi nile.
“ … Otu nwanyi onye nke gabị-garala ọtụtụ ihe nwale na nwute ọtụtụ afọ, ji akwa-anya-mmiri kwuo, Ámatawom na adizim ka akwụkwọ-ego 20-dollar — fukọrọ-afukọ,dọkara-adọka, ruru-iyi, metọọ, ma nwe apa. Mana … Akam bara-uru nke 20 dollars bara.’ Nwanyị a maara na ọ … bakwara uru nke bụ nye [Chineke] mere ịzịpụ nwa Ya ka ọbịa kwụọ-ụgwọ maka ya, na-otu-na-otu. Nwanyị ọbụla na Nzụkọ-nsọ a kwesịrị ịma ịhe nwanyị a maara.”2
Site na Akwukwọ-nsọ nile
Site na Akụkọ ochie anyị
Testament nke Ọhụrụ kọrọ akụkọ maka ụmụnwanyị ndị nke gosipụtara ọkwụkwe ha na Jisọs Kraịst, mụọ ma biekwa nkụzi Ya nile, ma gbaa-kwa ama gbasara ịje-ozi, ọrụ-ebube nile, na ebube Ya.
Jisọs gwara nwanyị ahụ n’akụkụ olulu-mmiri.
“Ọnye ọbụla ga nke ga ańụ mmiri nke mụ onwem ga-enye ya, akpịrị-mmiri agaghị akpọ ya; kama mmiri ahụ nke mụ onwem ga enye ya ga-aghọ n’ime ya isi-iyi na asọpụta ruo ndụ ebigh-ebi.
“Nwanyi ahụ siri ya, Onye-nwem, nyem mmiri a ka akpiri-mmiri wee ghara ịkpọm nku . …
“Amataram na Mesaịa na-abịa, … : mgbe ọbụla onye ahụ ga-abịa ọ ga-akọrọ anyị ịhe nile.
“Jisọs sịrị ya, Mụ onwem nke na-agwa gị okwu bụ ya.”
Nwanyị ahụ “mgbe ahụ hapụrụ ite-mmiri” ma gaa n’ime obodo gbaa ama gbasara Ya (Lee Jọn 4:6–30.)
© 2014 site na Intellectual Reserve, Inc. Ikike nbịpụta nile ejikọtara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/13. Nkwado ntụgharị-asụsụ: 6/13. Ntụgharị-asụsụ nke Visiting Teaching Message, April 2014. Igbo. 10864 593
Gịnị ka m nwere ike ịme?
-
Kedụ ka anyị ga esi gosipụta afọ ojuju ebe Onye-nzọpụta,Onye Mgbapụta, Jisọs Kraịst?
-
Kedụ ka anyị ga esi rite ngọzị nile nke aja mgbapụta nke Onye nzọpụta anyị na ndụ anyị?