Ka Ịdịrị Ọcha
Nchegharị kwa ụbọchị na-enyere anyị aka ịghọta nduzi nke Onyenwe anyị site na Mmụọ Nsọ.
Mgbe m gbara ihe dị ka afọ ise, a naara m akụ bọl mụ na ndị enyi m n’azụ ụlọ nzukọ nsọ nọ n’obere ọnụmara m na Cote d’Ivoire. Echetara m nke ọma oku onye nkwusa ozi ọma kpọrọ ndị ọgbakọ ya ịsacha uwe ha na nkwadobe maka ọbịbịa nke Onye Nzọpụta. Ebe m bụ nwata, eweere m oku nke a dị ka esi kwuo ya. Agbalara m ebe obibi ọsọ ọsọ dị ka otu obere ụkwụ m nwere ike ibuga m ma rịọ nne m ka ọ saa uwe m ndị dị ole ma ole nke ga-eme ka m ghara inwe ntụpọ ma dị njikere maka ọbịbịa nke Onye Nzọpụta ụbọchị na-esote. Na-agbanyeghị na nne m ekwenyechaghị na nlọghachi dị ire nke Onye Nzọpụta, ọ ka sakwara uwe m nke kachasị mma.
N’ụtụtụ na-esote, e yirilam ume ahụkwa na-akọchaghị akọcha na ọnụnụ ọkụ nke obi chere maka ọkwa banyere mbịarute nke Onye Nzọpụta. Dị ka ụbọchị na-agbadata ma o nweghị ihe mere, e kpebiri m ịga n’ụlọ ọgbakọ. O wutere m nke ukwuu ịhụ na nzụkọ nsọ tọgbọrọ chakoo ma Onye Nzọpụta abịarutabeghị. I nwere ike iche otu o jiri dịrị m dị ka m jiri nwayọ nwayọ laa n’ebe obibi.
Ka ọtụtụ afọ gasịrị, dị ka m na-anata ọmụmụ ihe onye mgbasa ozi ọma na nkwadobe maka isonye Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a, a gụrụ m nke a na-esote: Ma ọdịghị ihe ọbụla na-adịghị ọcha nwere ike ịbata niime alaeze ya; ya mere ọ dịghị ihe ga-abata niime ezumiike ya ma ọ bụghị ma ọ bụ ndị ahụ na asachawo gamentị ha niile n’ọbara m, niihi okwukwe ha, na nchegharị nke mmehie ha niile, na ikwesi ntụkwasị obi ha ruo ọgwụgwụ.”
Nkọwa doro anya m nwetere n’oge ahụ nyeere m aka ịghọta eziokwu dị mkpa nke gbanahụrụ ntakịrị uche m ọtụtụ afọ gara aga. Ozi nke onye nkwusa ozi ọma ahụ hiwere isi na mkpa ịdị ọcha nke ime mmụọ dị. Ọ gbara ndị ọgbakọ ume ịchọ nchegharị, mee mgbanwe niile niime ndụ ha, ma chigharịa n’ebe Onye Nzọpụta nọ maka mgbapụta ha.
Nna anyị nke Eluigwe ghọtara njem ndụ anụ ahụ anyị na banyere mmehie nọ niime anyị na-enweghị mgbagha. Eji m obi m niile enye ekele na O nyewo Onye Nzọpụta ịkwụ ụgwọ maka njehie anyị niile. Site na aja mgbapụta nke Onye Nzọpụta, onye ọbụla niime anyị nwere ike chegharịa ma chọọ mgbaghara ma bịa dị ọcha. Nchegharị, ụkpụrụ maka ntọala nke ozi ọma, dị oke mkpa maka uto nke ime mmụọ anyị na akwaa akwụrụ dị ka anyị na-agabiga ihe aka mgba niile nke ndụ.
N’oge ọgbakọ Zuru ọha nke Eprel 2022, Onyeisi Russell M. Nelson kpọkuru ndị otu Nzukọ nsọ niile inweta nhụmiihe ọńụ nke nchegharị kwa ụbọchị. O kwuru:
“Biko atụla ụjọ ma ọ bụ gbuo oge inwe nchegharị. Setan na-enwe ańụrị n’oke nchekasị nke obi gị. Gbuo ya mkpụmkpụ. Wezuga mmetụta ya n’ụzọ ndụ gị. Malite n’ụbọchị taa inweta nhụmiihe ọńụ nke iwezuga mmadụ eke. Onye Nzọpụta hụrụ anyị naanya mgbe niile mana nke ka nke mgbe anyị chegharịrị. …
“Ọ bụrụ na i chere na ị kpafuwo n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ gatee anya ma ọ bụ ogologo oge ma nwekwaghị ụzọ ịlọghachi, nke ahụ abụghị nnọọ eziokwu.”
Ọ bụrụ na enwere ihe nke na inwebeghị nchegharị n’uju ya, ana m agba gị ume ịńa ntị n’oku nke Onyeisi Nelson ka ịhapụ igbu oge maka nchegharị gị. O nwere ike ịchọ mgbamume iji banye n’usoro nke a; otu osila dị, e nwere m ike ịmasi unu obi ike na ọńụ nke na-esi na ezi nchegharị apụta karịsịrị nghọta. Site na nchegharị, ibu arụ anyị nke ikpe ọmụma ka ana ebuli ma dochie ya site na uche nke udo na obi iru ala. Dị ka anyị na-eji obi anyị niile echegharị, ana edo anyị nsọ site na ọbara nke Onye Nzọpụta, na-abawanye ịdị njikere anyị nye mkpalite niile na mmetụta nke Mmụọ Nsọ.
Onye nsiso m nke ebighị ebi ka amụrụ site na nsogbu nke anaghị anụzi ntị nke ọma ma niihi nke a ahaghị iyi nnyemaka nnụrụ. Uzuzu na ọsụsọ nwere ike imekụta ịrụ ọrụ nke ngwaọrụ ndị a, ma ya mere ụtụtụ ọbụla ana m ahụ ya ka ọ na-ehicha tuubu ndị na-ejikọ ha nke ọma tupu iyiri nkwa enyemaka ndị ahụ. Ihe omume nke a ana eme dị mfe ma na-adịgide na-ewepụ unyi, ihe dị mmiri mmiri ọbụla, ma ọ bụ kọndenseshọn, wee site otu ahụ emete nke ọma ike ya ịnụ ihe na ịkparịta ụka nke ọma. Mgbe o leghere ihe omume nke ụbọchị nke anya, ike ya ịnụ ihe na-enwe nsogbu ụbọchị ahụ niile, okwu ndị ekwuru ekwu ejiri nwayọ nwayọ na-anyụ ka ọkụ ma mesịa ghọọ ihe na-anaghị anụ anụ. Dị nnọọ ka nhicha ngwa nnụrụ ya kwa ụbọchị na-enye ya ohere ịnụzi ntị nke ọma, nchegharị kwa ụbọchị na-enye anyị ohere ịghọta nduzi nke Onyenwe anyị site na Mmụọ Nsọ.
Na ngwụcha ozi nke anụ ahụ nke Onyenwe anyị na tupu ọpụpụ Ya site n’Ogige nke Gethsemane, Ọ kwadoro ndị na-eso ụzọ Ya izute nnwale ndị na-abịa abịa. O kwere ha nkwa, na-asị: “Mana Onye nkasi obi, nke bụ Mmụọ Nsọ, onye nke Nna ga-ezite n’aha m, ọ ga-akuziri unu ihe niile, ma weta ihe niile na ncheta unu, ihe ọbụla ọ bụ m kwuru nye unu.”
Otu niime ọrụ ndị dị oke mkpa nke Mmụọ Nsọ bụ ịdọ aka na ntị, idu, na iduzi mmadụ ọbụla onye nke na-ege ntị nye olu ahụ dị nro, dị ime ime. Dị nnọọ ka tuubu mkparịta ụka suchiri asụchi nke ngwa nnụrụ nwere ike igbochi ịrụzi ọrụ otu o kwesịrị, njikọ nke ime mmụọ anyị na Nna nke Eluigwe nwekwara ike imebi, na-eduba na nghọtahie jọgburu onwe ya ma ọ bụ ọdịda ịńa ntị na ndụmọdụ Ya. Ọbịbịa nke intanet emewo ka ana enwete ozi nke ọma karịa ka ọ dịbuuru na mbụ. Nke a nwere ike iduba anyị na-ilekwasị ụwa anya maka nduzi karịa na Chineke. Onyeisi Russell M. Nelson adọwo anyị aka na ntị na “n’ụbọchị ndị n’abịa abịa, ọ gaghị ekwe omume ịnya ndụ ime mmụọ na-enweghi nduzi, ntuziaka, nkasị obi na mmetụta nke Mmụọ Nsọ na-adịgide.”
Obi m juru n’ekele na onye ọbụla niime anyị nwere ike ịnata onyinye nke Mmụọ Nsọ n’oge ime emume nnabata anyị. Otu osila dị, Onyeisi Dallin H. Oaks adọwo aka na ntị na “ngọzi ndị dị adị site n’onyinye nke Mmụọ Nsọ dabeere n’elu ntozu oke [ma] ‘Mmụọ nke Onyenwe anyị anaghị ebi na tempụl ndị na-adịghị nsọ’ [Helaman 4:24].”
Mgbe anyị kpachapụrụ anya họrọ isoro nduzi nke ndị amụma na ndị ozi, ike anyị inwe Mmụọ Nsọ dị ka onye nsiso mgbe niile na-etolite. Mmụọ Nsọ na-eweta anya odido na-ime mkpebi, na-akpalite echiche niile na mmetụta niile nke dabara ya na uche nke Nna nke Eluigwe. Inwe Mmụọ Nsọ dị ka onye nsiso mgbe niile dị oke mkpa maka uto nke ime mmụọ anyị.
Na nso nso a enyere m ọrụ onyeisi oche ịhụ maka ọgbakọ stek na Salt Lake Granger West Stake na Utah. N’oge ihe omume nke a, ezutere m onyeisi stek onye na-agbasiwo mbọ ike iwulite ike ya iji ghọta mkpalite niile nke mmata ihe dị iche site na ibi ndụ ezi omume na ime nchegharị kwa ụbọchị. Dị ka otu akụkụ nke mbọ ije ozi nlekọta anyị, anyị haziri nleta nke ndị otu ezi na ụlọ atọ. Mgbe anyị mezuru nleta nke ikpeazụ anyị, anyị hụtara onwe anyị inwe akpọ ya nnọọ nkeji 30 fọdụrụ tupu ihe omume anyị nke ọzọ. Dị ka anyị na-alaghachi na stek center, Onyeisi Chesnut nwetara mmetụta ịga letakwuo otu ezi na ụlọ. Anyị abụọ kwekọtara isoro mkpalite nke a.
Anyị gawara ileta ezi na ụlọ Jones, ebe anyị chọpụtara Nwanne nwanyị Jones anaghị ebilite na-akwa niihi ọrịa. O kwere nghọta na o nwere mkpa ịnata ngọzi nke ọkwa nchụaja. Site n’ikike ya, anyị nyere ya. Dị ka anyị na-akwado ịpụwa, Nwanne nwanyị Jones jụrụ ka anyị si mara banyere mkpa ya dị ọkụ ọkụ maka ngọzi. Nke bụ eziokwu bụ, anyị amaghị. Ka osila dị, Nna nke Eluigwe, onye maara mkpa ya niile, maara ma kpatee mmụọ Onyeisi Chesnut ije leta ebe obibi ya. Mgbe anyị dị njikere ịnata nduzi nke olu nta, dị jụụ, anyị na-enwe nkwado kacha mma iji dị nkọ karịa n’ilekọta ndị ahụ nọ na mkpa.
Ana m agba ama banyere Nna nke Eluigwe nwere obi ọma ma dị ịhụnaanya. Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta nke ụmụ mmadụ. Ana m agba ama na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst dị ire ma na dị ka anyị na-amụ isoro nduzi nke Mmụọ Nsọ, Ọ ga-edu anyị ichegharị ma jiri ike nke Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta mee ihe na ndụ anyị. Onyeisi Russell M. Nelson bụ ezigbo onye amụma nke Onyenwe anyị dị ndụ, ji ntụghe niile nke ọkwa nchụaja nọ n’ụwa taa. N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.