2020–2024
Yikwasịnu Onyenwe anyị Jizọs Kraịst
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


11:56

Yikwasịnu Onyenwe anyị Jizọs Kraịst

Site n’ịkwanyere ọgbụgba ndụ anyị ugwu, anyị na-enye Chineke ike ịwụpụta igwe ngọzi niile e kwere nkwa metụtara ọgbụgba ndụ ndị ahụ.

Dị ka ụmụ m abụọ ndị kachasị nta na-etolite, a chọpụtara m akwụkwọ ndị na-enye obi ụtọ na nke dị mmasị mana nakwa eji ihe atụ niime akụkọ ha niile. Dị ka anyị na-agụkọta ihe ọnụ n’oge mgbede niile, ọ na-amasị m inyere ụmụ m aka ghọta ihe atụ onye odee naara eji akuzi ụkpụrụ ndị miri emi, ọbụna ụkpụrụ niile nke ozi ọma.

A maara m na nke a na-emikpu otu ụbọchị mgbe nwa m nwoke nta nọ n’afọ isimbụ iri na ụma ya. Ọ malitewo ịgụ otu akwụkwọ ọhụrụ ma chọrọ nnọọ inwe obi ụtọ n’akụkọ dị na ya, mana uche ya nọgidere ịgba mbọ ịchọta mpụtara miri emi nihe niile ọ na-agụ. Mmụọ ya kụdara, mana a nọọrọ m na-amụ amụ niime obi m.

Jizọs kuziri ihe site n’akụkọ niile na ihe atụ niile—mkpụrụ mọstaadị iji kuzie ike nke okwukwe, nwa atụrụ furu efu iji kuzie uru mkpụrụ obi niile, nwa mmefu iji kuzie agwa Chineke. Nkọnilu Ya niile bụụrụ ihe atụ site na nke O nwere ike ikuzi ihe miri emi nye ndị ahụ nwere “ntị ịnụ ihe.” Mana ndị ahụ na-adịghị achọ mpụtara miri emi agaghị aghọta, dị nnọọ ka ọtụtụ ndị na-agụ otu ụdị akwụkwọ ndị ahụ m na-agụrụ ụmụ m amaghị ma ọlị na-enwere mpụtara miri emi na ọtụtụ ndị ọzọ inwete niime akụkọ ndị ahụ.

Mgbe Chineke Nna nyere Ọkpara Ya A Mụrụ Naanị Ya dị ka aja maka anyị, Jizọs Kraịst N’onwe Ya bụrụziri ihe atụ kachasị elu nke ịhụnaanya na-adịghị anwụ anwụ nke Nna bi N’eluigwe maka onye ọbụla niime anyị. Jizọs Kraịst bụrụziri Nwa atụrụ nke Chineke

Anyị nwere ohere na ngọzi nke ịbụ ndị akpọrọ oku baa niime mmekọrịta ọgbụgba ndụ anyị na Chineke, nke na ndụ nke onwe anyị nwere ike bụrụ ihe atụ nke ọgbụgba ndụ ahụ. Ọgbụgba ndụ na-ekepụta mmekọrịta nke na-ekwe ka Chineke kpụọ ma gbanwee anyị dị ka oge na-aga ma bulie anyị ịbụrụ karịa dị ka Onye Nzọpụta, na-adọta anyị nso nso nye Ya na Nna anyị ma n’ikpeazụ na-akwado anyị ịbanye n’ihu Ha.

Onye ọbụla n’elu ụwa bụ nwa nwoke ma ọbụ nwa nwanyị a hụrụ naanya nke Chineke. Mgbe anyị họọrọ ịbụ akụkụ nke ọgbụgba ndụ, ọ na-eweli ma mikpuo mmekọrịta anyị na Ya. Onyeisi Russelll M. Nelson akuziwo na mgbe anyị họọrọ ime ọgbụgba ndụ anyị na Chineke, mmekọrịta anyị na Ya nwere ike dịrịzie nso karịa ka ọ dị tupu ọgbụgba ndụ anyị, ma ọ na-enye Ya ike ịgọzi anyị jiri atụ ndị ọzọ nke ebere na ịhụnaanya Ya, ịhụnaanya nke ọgbụgba ndụ a na-akpọ hessed n’asụsụ Ndị Hibru. Ụzọ ọgbụgba ndụ bụ naanị banyere mmekọrịta anyị na Chineke—mmekọrịta hesed anyị na Ya.

Nna anyị na-achọ mmekọrịta miri emi ya na ụmụ Ya ndị nwoke niile na ụmụ Ya ndị nwanyị niile, mana Ọ bụ nhọrọ anyị. Dị ka anyị na-ahọrọ ịbịaru Ya nso site na mmekọrịta ọgbụgba ndụ ọ na-ekwe Ya ịbịaru anyị nso ma gọzie anyị n’uju karịa.

Chineke na-ehiwe ọnọdụ na nkwa niile nke ọgbụgba ndụ ndị ahụ anyị na-eme. Mgbe anyị họọrọ ịbanye niime mmekọrịta ahụ, anyị na-agba aka ebe nye Ya site na omume ihe atụ nke ọgbụgba ndụ nke ọbụla, nke anyị dị njikere irube isi na ọnọdụ niile O hiweworo. Site n’ịkwanyere ọgbụgba ndụ anyị ugwu, anyị na-enye Chineke ike ịwụpụta imerime ngọzi ndị e kwere nkwa metụtara ọgbụgba ndụ ndị ahụ, gụnyere ike bawanyere iji gbanwee ma dịrịzie karịa dị ka Onye Nzọpụta anyị. Jizọs Kraịst nọ n’etiti ọgbụgba ndụ niile anyị na-eme, ma ngọzi ọgbụgba ndụ niile ka e mere ọ dị ire niihi aja mgbaghara mmehie Ya.

Baptizim site n’irukpu bụ ọnụ ụzọ ama atụ site n’ebe anyị si abanye niime mmekọrịta ọgbụgba ndụ anyị na Chineke. Ị na-emikpu niime mmiri na ịpụta ọzọ bụ ihe atụ nke ọnwụ na Mbilite n’ọnwụ nke Onye Nzọpụta ruo na ndụ ọhụrụ. Dị ka a na-eme anyị baptizim, anyị na-anwụ n’ụdị ihe atụ ma a mụọ anyị ọzọ niime ezi na ụlọ nke Kraịst ma gosi na anyị dị njikere iwekwasị onwe anyị aha Ya. Anyị onwe anyị na-egosi ihe atụ nke ọgbụgba ndụ ahụ. Niime Testament Ọhụrụ anyị na-agụ, “N’ihi na ka ha ra bụ unu ndị meworo baptizim niime Kraịst eyikwasiwo Kraịst.” Site na baptizim anyị anyị na-eyikwasị Kraịst n’ụzọ ihe atụ.

Emume nsọ nke oriri nsọ na-atụkwa aka na Onye Nzọpụta. Achịcha na mmiri ahụ bụ ihe atụ nke anụ ahụ na ọbara nke Kraịst kwafuru maka anyị. Onyinye nke Aja mgbaghara mmehie Ya ka enyere anyị n’ụzọ ihe atụ izu ụka ọbụla mgbe onye ji ọkwa nchụaja, na-anọchite Onye Nzọpụta N’onwe Ya, na-enye anyị achịcha na mmiri. Dị ka anyị na-eme omume nke iri na ịńụ ihe nnọchianya nke anụ ahụ na ọbara Ya, Kraịst na-abụrụzi akụkụ anyị n’ụzọ ihe atụ. Anyị na-eyikwasị kwa Kraịst ọzọ dị ka anyị na-eme ọgbụgba ndụ ọhụrụ izu ụka ọbụla.

Dị ka anyị na-eme ọgbụgba ndụ anyị na Chineke niime ụlọ nke Onyenwe anyị, anyị na-emikpukwu mmekọrịta anyị na Ya. Ihe niile anyị na-eme niime tempụl na-atụrụ anyị aka na atụmatụ nke Nna, nke Onye Nzọpụta na aja mgbaghara mmehie Ya nọ n’etiti ya. Onyenwe anyị ga-akuziri anyị ahịrị n’elu ahịrị site na ihe atụ nke emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile dị ka anyị na-emepe obi anyị ma chọọ site n’ekpere ịghọta mpụtara niile miri emi.

Dị ka akụkụ onyinye dị nsọ tempụl, enyere anyị ikike iyi gament nke ọkwa nchụaja dị nsọ. Ọ bụ ma nkwa dị nsọ ma ohere dị nsọ.

Niime omenaala okpukperechi niile, uwe elu ahụ ahụ pụrụ iche ka a na-eyi dị ka ihe atụ nke nkwenye na mkpebi nke onye ahụ nye Chineke, ma uwe oyiyi mmemme ka ndị ahụ na-edu nzukọ ofufe niile na-eyikarị. Uwe oyiyi ndị ahụ dị nsọ na-ebu mpụtara miri emi nye ndị ahụ yi ha. Anyị na-agụ niime akwụkwọ nsọ na n’oge mgbe ochie niile, uwe mmemme dị nsọ ka a na-eyikwa na njikọ ya na ntọaja tempụl niile.

Dị ka ndị otu nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, anyị onwe anyị ndị họrọworo ime ọgbụgba ndụ niile ha na Chineke niime ụlọ nke Onyenwe anyị na-eyi uwe mmemme dị nsọ noge ofufe tempụl, bụ ihe atụ nke uwe ahụ a na-eyi na ntọaja tempụl niile mgbe gboo. Anyị nakwa eyi onyinye dị nsọ nke ọkwa nchụaja dị nsọ, ma noge ofufe tempụl ma na ụbọchị ndụ anyị niile.

Gament nke ọkwa nchụaja dị nsọ bụ dị ka ihe atụ dị omimi ma nakwa na-atụ aka na Onye Nzọpụta. Mgbe Adam na Iv riri mkpụrụ osisi ma bịa hapụ Ogige nke Iden, enyere ha kootu nke akpụkpọ dị ka ihe mkpuchi nyere ha. O yikarịrị ka na ejiri otu anụmanụ ji chụọ aja iji mepụta kootu nke akpụkpọ niile—dị ka ihe atụ nke aja nke onwe nkeOnye Nzọpụta nyere anyị. Kaphar bụ isi mkpụrụ okwu Ndị Hibru maka aja mgbaghara mmehie, ma otu niime mpụtara ya bụ “ikpuchi.” Gament anyị na-echetara anyị na Onye Nzọpụta na ngọzi niile nke Aja mgbaghara mmehie Ya na-ekpuchi anyị gburugburu ndụ anyị. Dị ka anyị na-eyikwasị gament nke ọkwa nchụaja dị nsọ ụbọchị ọbụla, ọmarịcha ihe atụ ahụ na-abụrụzi akụkụ anyị.

N’akwụkwọ Ndị Rom niime Testament Ọhụrụ, anyị na-agụ: “Abalị agafewo nke ukwuu, ụtụtụ adịwo nso: ka anyị ya mere chụpụ ọrụ niile nke ọchịchịrị, ma ka anyị yiri ngwa nchekwa nke ìhè. … Yikwasịnu Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.”

Obi juru m n’ekele maka ohere nke iyi gament nke ọkwa nchụaja dị nsọ iji chetara m na Onye Nzọpụta na ngọzi Aja mgbaghara mmehie Ya na-enweghị ọgwụgwụ na-ekpuchite m mgbe niile gburugburu njem ndụ anụ ahụ m. Ọ nakwa echetere m na dị ka m na-edebe ọgbụgba ndụ niile m meworo mụ na Chineke n’ụlọ nke Onyenwe anyị, eyikwasịwo m Kraịst n’ụdị ihe atụ, onye N’onwe Ya bụ ngwa nchekwa nke ìhè. Ọ ga-echekwa m site na ajọọ ihe, nye m ike na ikike bawanyere, ma bụrụ ìhè m na odudu m site n’ọchịchịrị na ihe isi ike niile nke ụwa nke a.

E nwere mpụtara ihe atụ dị omimi na nke mara mma dị niime gament nke ọkwa nchụaja dị nsọ na mmekọrịta ya nye Kraịst. E kwere m na njikere m iyi gament ọkwa nchụaja dị nsọ na-abụrụzi ihe atụ m nye Ya. Ọ bụ ihe iriba ama nke onwe m nye Chineke, na-abụghị ihe iriba ama nye ndị ọzọ.

Obi dị m ekele maka Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst. Aja mgbaghara mmehie Ya maka anyị ghọziri ihe atụ kachasị ukwuu nke Ya na ịhụnaanya na-enweghị ọgwụgwụ nke Nna anyị bi N’eluigwe maka onye ọbụla niime anyị, jiri ihe atụ a na-ahụ anya nke ịhụnaanya na aja ahụ—akara niile dị n’aka, ụkwụ, na akụkụ nke Onye Nzọpụta—nọgidere ọbụna mgbe Mbilite n’ọnwụ Ya gasịrị.

Dị ka m na-edebe ọgbụgba ndụ m na nkwa m niile mụ na Chineke, gụnyere iyi gament nke ọkwa nchụaja dị nsọ, ndụ m n’ezie nwere ike bụrụ ihe atụ nke onwe nke ịhụnaanya m na obi ekele m miri emi maka Onye Nzọpụta m, Jizọs Kraịst, na ọchịchọ m inwe Ya ịnọnyere m mgbe niile.

Ọ bụrụ na i mebeghị otu ahụ, ana m akpọku gị ịhọrọ mmekọrịta dị omimi karịa gị na Chineke site na ime ọgbụgba ndụ niile gị na Ya niime ụlọ nke Onyenwe anyị. Mụọ okwu niile nke onye amụma anyị (ọmarịcha nkuzi niile dị na nkọwada niile nke okwu ya, nke ọtụtụ okwu ọgbakọ nwere). O kwuwo ugboro ugboro n’ọtụtụ afọ banyere ọgbụgba ndụ ma kacha nke kemgbe ịbụ Onyeisi Nzukọ nsọ. Mụta site na nkuzi niile banyere ọmarịcha ngọzi niile ma ike na ikike bawanyere nke nwere ike ịbụ nke gị site na ime ọgbụgba ndụ niile gị na Chineke.

Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe na-ekwu na ọ dịghị mkpa inwe ọkpụkpọ oku mishọn ma ọ bụ kwere ịlụ ọlụlụ iji mee ọgbụgba ndụ niile nke tempụl. Mmadụ ga-agbarịrị opekempe afọ 18, na-adịghị aga ụlọakwụkwọ sekọndịrị ma ọ bụ nke ya na ya ha, ma bụrụ onye otu Nzukọ nsọ opekempe otu afọ. E nwekwara ọkọlọtọ niile nke ịdị nsọ nke onwe a na-achọ. Ọ bụrụ na i nwere ọchịchọ nke imikpu mmekọrịta gị na Nna bi N’eluigwe na Jizọs Kraịst site na ime ọgbụgba ndụ ndị dị nsọ niime ụlọ nke Onyenwe anyị, ana m akpọku unu ikwuru bishọp ma ọ bụ onyeisi ngalaba nta gị ma mee ka ọ mara ọchịchọ gị. Ọ ga-enyere gị aka mata otu esi akwado ịnata ma sọpụrụ ọgbụgba ndụ ndị ahụ.

Site na mmekọrịta ọgbụgba ndụ anyị na Chineke, ndụ nke onwe anyị nwere ike bụrụ ihe atụ ibi ndụ nke mkpebi anyị na ịhụnaanya miri emi maka Nna anyị bi N’eluigwe, hesed anyị maka Ya, na ọchịchọ anyị ịganiihu ma n’ikpeazụ dịrịzie dị ka Onye Nzọpụta anyị, dịrị njikere n’otu ụbọchị ịbanye niihu Ha. Ana m agba ama na nnukwu ngọzi niile nke mmekọrịta ọgbụgba ndụ ahụ ruru nke ọma ọnụ ahịa ha. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. Lee Mak 4:33–34.

  2. Lee Matiu 17:20.

  3. Lee Luk 15:3–7

  4. Lee Luk 15:11–32.

  5. Matiu 13:9

  6. Lee Matiu 13:10-13.

  7. Lee Jọn 3:16–17.

  8. Lee Jọn 1:29; 1 Nifaị 11:20–22; lee kwa Russell M. Nelson, “Aja mgbaghara mmehie Ahụ,” Ensign, Nov. 1996, 34–35.

  9. “Site n’ịbanye niime ọgbụgba ndụ anyị na ya, Chineke adịghị naanị arachi anyị nye Ya, mana ọ dị nnọọ ka O kegidere anyị n’azụ Ya ma kpọrọ anyị gaa naanị ebe O nwere ike ịga”(Kerry Muhlestein, Chineke Ga-emerị: Ọgbụgba ndụ Mgbe Gboo niile, Ngọzi Oge Ugbu a, na Mkpokọta nke Israel [2021], 8). Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 133:53.

  10. “Ndi mmadụ niile—nwoke na nwanyi—ka e kere n’oyiyi nke Chineke. Nke ọbụla bụ nwa nwoke ma-ọbụ nwa nwanyị mmụọ a hụrụn’anya nke nne na nna nke eluigwe, ma, n’ụdị ahụ, nke ọbụla nwere ụdị okike na akaraka dị nsọ” (“Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa amara nye Ụwa,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma).

  11. Hesed bụ … okwu na-akọwa mmekọrịta ọgbụgba ndụ nke na akụkụ abụọ ahụ ga-adịrịrị umeala ma kwesị ntụkwasị obi nye ibe ha. … Niihi Chineke emewo hesed maka ndị ahụ gbaworo ndụ ha na Ya, … Ọ ga-aganiihu isoro ha rụọ ọrụ ma nye ha ohere iji gbanwee. … Ma ha ga-akpafu, Ọ ga-enyere ha aka chọta ụzọ ha laghachikwute Ya,” dị nnọọ ka O mere ọtụtụ mgbe Ya na ndị ọgbụgba ndụ Ya n’oge Testament Ochie. “Mgbe anyị banyere na ọgbụgba ndụ anyị na Chineke, anyị na Ya emewo ọgbụgba ndụ onye ga-edebe okwu Ya mgbe niile. Ọ ga-eme ihe niile O nwere ike ime, na-emebighị ohere nhọrọ anyị, inyere anyị aka debe nke anyị” (Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ Dị Ebighị ebi,” Liahona, Oct. 2022, 6, 11; lee kwa Muhlestein, Chineke Ga-emeri, 9–12; Ditoronọmi 7:9).

  12. Chineke enweghị ike ahapụ mmekọrịta ọgbụgba ndụ Ya. “Ọ gaghị ma ọlị ada mba na mbọ Ya inyere anyị aka, ma anyị agaghị enwe ike ma ọlị ewete na ngwụcha ndidi obi ebere Ya n’ebe anyị nọ” (Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ Dị Ebighị ebi,” 6). Ekechikọtara anyị ọnụ n’ọńụ site na ọgbụgba ndụ dị ebighị ebi.

  13. Lee Jeremaya 31:33; 1 Nifaị 17:40; Russell M. Nelson, “Kwe ka Chineke Merie,” Liahona, Nov. 2020, 92.

  14. See Jemis 4:8; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:63.

  15. Lee Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ,” Liahona, Nov. 2011, 86.

  16. Lee Mozaya 5:5; 18:8–10.

  17. Lee Russell M. Nelson, “Akụ niile nke Ime Mmụọ,” Liahona, Nov. 2019, 77; Russell M. Nelson, “Tempụl na Ntọala nke Ime Mmụọ Gị,” Liahona, Nov. 2021, 94; Russell M. Nelson, “Merie Ụwa ma Nweta Ezumiike,” Liahona, Nov. 2022, 96; Camille N. Johnson, “Jizọs Kraịst Bụ Enyemaka,” Liahona, Me 2023, 82; Dale G. Renlund, “Inweta Ike nke Chineke site na Ọgbụgba ndụ niile,” Liahona, Me 2023, 35–37; Jean B. Bingham, “Ọgbụgba ndụ Anyị na Chineke Na-agba anyị Ume, ma Na-echekwa, ma Na-akwado Anyị maka Otuto Dị Ebighị ebi,” Liahona, Me 2022, 66.

  18. Lee Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ Dị Ebighị ebi,” 7.

  19. Lee Ndị Rom 6:3–4; Ndị Kọlọsị 2:12.

  20. Lee 2 Nifaị 31:13; Moronaị 6:3; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77.

  21. Ndị Galetia 3:27

  22. Lee Luk 22:19–20

  23. Lee Jọn 6:56

  24. Onyeisi Russell M. Nelson kwuru sị: “Mgbe niile, ana m anụ nkọwa na anyị na-eri oriri nsọ iji megharịa ọgbụgba ndụ ndị anyị mere na baptizim. Ebe nke ahụ bụ eziokwu, ọ karịrị ihe ahụ. Emewo m ọgbụgba ndụ ọhụrụ. I mewo ọgbụgba ndụ ndị dị ọhụrụ” (niime Dale G. Renlund, “Mkpebi Na-adịghị Ada ada nke Jizọs Kraịst,” Liahona, Nov. 2019, 25, nkọwada 18).

  25. Lee Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ Dị Ebighị ebi,” 10.

  26. Lee Russell M. Nelson, “Tempụl na Ntọala nke Ime Mmụọ Gị,” 93–94.

  27. Lee 2 Nifaị 28:30

  28. Lee “Uwe Tempụl Dị nsọ,” ChurchofJesusChrist.org.

  29. Lee Ọpụpụ 28; 40:12–13.

  30. Lee “Uwe Tempụl Dị nsọ,” ChurchofJesusChrist.org.

  31. Lee Jenesis 3:21

  32. Lee Russell M. Nelson, “Aja mgbaghara mmehie,” 34.

  33. Ndị Rom 13:12, 14.

  34. Lee Ndị Efesọs 6:10–18.

  35. Lee Mosiah 24:13–15; David A. Bednar, “Na-ebu Ibu Ha N’ụzọ dị Mfe,” Liahona, Me 2014, 88–89.

  36. Lee Abụ ọma 119:105; 1 Nifaị 17:13

  37. Okenye Neal A. Maxwell kuziri, “Nrube isi nye uche nke onwe bụ n’ezie otu ihe nke onwe pụrụ iche anyị kwesịrị idebe n’elu ebe nchụaja nke Chineke” (“Elobara niime Uche nke Nna,” Ensign, Nov. 1995, 24).

  38. Ọ bụghị maka mmasị nke onwe, ekweghị ndaba, ma ọ bụ aka nka, mana niihi ọnọdụ ahụike ụfọdụ, maka ụfọdụ ndị, iyiri gament ahụ jị dị ike karịchaa. Onyenwe anyị maara obi anyị ma ghọtara ọchịchọ anyị iji kwanyere mkpebi anyị ugwu. Lee, iji maatụ, Mozaya 4:24-25.

  39. Anyị ekwesịghị ịchọ ikpe ojiji tempụl gament ndị ọzọ ikpe. Lee Alma 41:14; lee kwa Dieter F. Uchtdorf, “Ndị Obi ebere Na-anata Ebere,” Liahona, Me 2012, 70, 75.

  40. Lee Jeffrey R. Holland, “Ọdịghị Onye Nọnyeere Ya,” Liahona, Me 2009, 86–88.

  41. Lee Jọn 3:16–17; 15:12–13; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 34:3.

  42. Lee Aịzaya 49:14–16

  43. Lee Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ Dị Ebighị ebi,” 4–11; “Akụ niile nke Ime Mmụọ,” 76–79; Russell M. Nelson “Kwe ka Chineke Merie,” 92–95; Russell M. Nelson “Tempụl na Ntọala Ime Mmụọ Gị,” 93–96; Russell M. Nelson “Merie Ụwa ma Chọta Ezumiike,” 95–98; Russell M. Nelson “Arịrịọ nye Ụmụnne M ndị Nwanyị,” Liahona, Nov. 2015, 95–97.

  44. Lee Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe: Ije ozi niime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazu a, 26.5.1, 27.2.2, Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  45. Lee Russell M. Nelson, “Okwu Mmechi,” Liahona, Nov. 2019, 121.

  46. Lee Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ Dị Ebighị ebi,” 11.