2010–2019
Ntụkwasị-obi Na-anọgide na Adaghị-mba
Ọgbakọ ozuru ọha nke onwa iri 2019


10:24

Ntụkwasị-obi Na-anọgide na Adaghị-mba

Ntụkwasị-obi n’ime Onye-nwe-anyị tinyere ịtụkwasị-obi n’ime oge Ya ma ọchọrọ ndidi na nnọgide nke na-anọkarị ebili-mmiri oke-ikuku nke ndụ.

Nwa anyị nwoke Dan dara ezigbo ọrịa mgbe ọ na-agbasa ozi-ọma n’ime Afrịka ma eburu ya ga na ụlọ-ọgwụ enweghị ngwọ-ọrụ nile. Dịka anyị gụrụ leta nke-mbụ odere anyị mgbe ọrịachara, anyị cherela na ọ ga-ada mba, kama o dere, “Dịka m dinara n’ime ụlọ-ndị-ọdị-ọjọọ ahụ, E nwere m udo. E nwetụbeghị m ụdị ọńụ nke nọgidere na adaghị-mba n’ime ndụ m.”

Dịka nwunye m na mụ gụrụ mkpụrụ-okwu nile ndị-ahụ, akwa gụrụ anyị Inwe ańụrị mgbe niile na enweghị egwu. Anyị anụtụbeghị ebe ejiri otu-ahụ kọwa ọńụ, kama mkpụrụ okwu ya niile dabara. Anyị maara na ọńụ ahụ ọ kọwara abụghị nanị inwe mmasị, ma-ọbụ inwe obi-ụtọ, kama udo na ọńụ ahụ nʼabịa mgbe anyị nyefere onwe anyị Chineke ʼma tụkwasị obi anyị nʼime Ya nʼime ihe niile. Anyị na onwe-anyị ahụkwala ihe ndị ahụ n’ime ndụ anyị mgbe Chineke kwuru udo nye mkpụrụ-obi anyị ma mee ka anyị nwere olile-anya n’ime Kraịst ọbụnaghị mgbe ndụ siri-ike na enweghị olile-anya.

Lehi kuziri na ọbụrụ na Adam na Eve adaghị, “ha gaara anọgide n’ọnọdụ enweghị ụta, enweghị ọńụ, n’ihi na ha amaghị ahụhụ ọbụla; …

“Ma lee, ihe nile ka e meworo site na amamihe nke ya bụ Onye-maara ihe nile.

“Adam dara ka mmadụ wee dịrị; ma mmadụ dị, ka ha wee nwee ọn̄ụ.”

N’ụzọ igbuduokwu, mkpagbu nile na iru-uju na-akwado anyị inwete ọńụ ọbụrụ na anyị ga-atụkwasị Onye-nwe-anyị obi na atụmatụ Ya maka anyị. Ezi-okwu nke a ka akọwara nke-ọma site nʼaka 13th-century poet: “Iru-uju nʼakwado gị maka ọńụ. Ọ na-eji ike zachapụ ihe-nile pụọ n’ụlọ gị, ka ọńụ ọhụrụ nwere-ike hụ ụzọ bata. Ọ na-ekpopụ ahịhịa kpọrọ-nkụ site na obi gị, ka ahịhịa dị-ndụ nwere-ike too n’ọnọdụ ha. Ọ na-adọpụta mgbọrọgwụ nile rerere, ka mgbọrọgwụ ọhụrụ nile zoro n’ala nwere ohere itolite. Ihe ọbụla iru-uju dọpụrụ site n’obi gị, ihe ndị ka nma ga-anọchi ha.”

Onye-isi Russell M. Nelson kuziri,“ Ọńụ ahụ Onye-nzọpụta nenye [anyị] … na-adịgide, nʼenye anyị obisike na ʼnsogbu anyị nile ga-abụ maka nwa oge nta’ [Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 121:7] ma do ya nsọ nye ihe-nketa anyị.” Ọnwụnwa na ihe isi-ike anyị nile nwere-ike nye ohere maka ọńụ kaa-aka.

Ozi dị nma ahụ nke ozi-ọma abụghị nkwa nke ndụ na-enweghị iru-uju na mkpagbu nile kama ndụ nke jupụtara na nzube ma nwee-isi—ndụ ebe iru-uju na mkpagbu anyị nile nwere-ike” elomiwo ya n’ime ọńụ nke Kraịst.” Onye-nzọpụta kwupụtara, “Na ụwa unu ga-enwe mkpagbu: ma na nwee nụ ańụrị; E-merie-la m ụwa.” Ozi-ọma Ya bụ ozi nke olile-anya. Iru-uju etinyere olile-anya n’ime Jizọs Kraịst ji nkwa nke ọńụ n’anọgide.

Akụkọ nke njem nke ndị Jared na ala ekwere-nkwa bụ ihe enwere-ike iji dịka oyiri maka njem anyị n’ime ụwa. Onye-nwe-anyị kwere nwanne-nwoke nke Jared na ndị ya nkwa na Ọ “ga-eburu [ha] ụzọ gaba n’ala nke bụ nke a họọrọ karịa ala nile nke ụwa.” O nyere ha iwu ịrụ ụgbọ-mmiri nile, ma ha gara n’irube-isi rụọ ha dịka ntuzi-aka nile nke Onye-nwe-anyị. Agbanyeghị, dịka ọrụ ahụ n’aga n’ihu, nwanne-nwoke nke Jared bia nwee mgbasa nile na atụmatụ nke Onye-nwe-anyị maka ụgbọ-mmiri ndị ahụ ezughị oke. Ọ kpọkuru:

“O Onye-nwe-anyị, aruwo m ọrụ nke i nyeworo m n’iwu, ma emewo m ụgbọ-mmiri ndị ahụ dịka i siri tụziere m aka.

“Ma lee, O Onye-nwe-anyị, nʼime ha ọdịghị ìhè dị.”

“O Onye-nwe-anyị, ị ga-ekwe ka anyị gafee nnukwu mmiri nke a nʼọchịchịrị?”

Isituwo otu ahụ kọsara Chineke mkpa gị? Mgbe ị na-agbalị ibi-ndụ dịka Onye-nwe-anyị tiri-n’iwu ma ihe nile atụrụ-anya anaghị apụta, ichetula-echiche ma ị ga-aga n’ime ndụ a nọchịchịrụ?

Nwanne-nwoke nke Jared mgbe ahụ mere mkpesa karịa gbasara ikike ha ịdị ndụ n’ime ụgbọ-mmiri ndị ahụ. O bee, “Na kwa anyị ga-ala nʼiyi, nʼihi na nʼime ha anyị enweghị ike iku-ume, ma ọbụghị ikuku nke dị nʼime ha.” Ihe isi-ike nile nke ụwa emetụla ka osiere gị ike iku-ume ma mee ka ichee ma inwere-ike pụta n’ụbọchị ahụ, emesịa laghachi na ebe-obibi nke elu-igwe gị?

Mgbe Onye-nwe-anyị nyere nwanne-nwoke nke Jared aka kpebie mkpesa ya nile, mgbe ahụ Ọ kọwara, “Unu enweghị ike ịgafe nnukwu omimi a ma ọbụghị na M kwadoro unu [ụzọ maka] megide mfegharị-mmiri nile nke oke-osimiri, na ikuku nile nke gapụworo, na ide-mmiri nile nke ga-abia.”

Onye-nwe-anyị mere ka odo-anya na ikpeazụ ndị Jared enweghị-ike ruo ala ahụ ekwere na nkwa ma ọbụghị Ya. Ihe adịghị ha n’aka, ma nanị ụzọ ha nwere-ike ijigafe nnukwu omimi ahụ bụ ịtụkwasị-obi n’ime Ya. Mmụta nile ndị a na nkuzi site n’aka Onye-nwe-anyị mere ka okwukwe nke nwanne-nwoke Jared mie-emie ma gbaa ntụkwasị-obi ya n’ime Onye-nwe-anyị ume.

Lee ka ekpere ya nile jiri gbanwee site na ajụjụ na mkpesa nile nye ngosipụta nke okwukwe na ntụkwasị-obi:

“A matara m, O Onye-nwe-anyị, na ị nwere ịke nile, ma ị ga-eme ihe ọbụla ịchọrọ maka ọ dị-mma nke mmadụ; …

“Lee, O Onye-nwe-anyị, ị nwere ike ime nke a. Anyị matara na i nwere ike igosịpụta nnukwu ike, nke dị ntakịrị nʼile-anya nye nghọta nke mmadụ.”

E dere na ndị Jared mgbe-ahụ “ha banyere n’ime … ụgbọ-mmiri ha nile,ma gawa n’ime oke osimiri, na-etinye onwe ha n’aka Onye-nwe-anyị Chineke ha.”tinye n’aka pụtara ịranye n’aka ma-ọbụ inyefe. Ndị Jared abanyeghị n’ime ụgbọ-mmiri ndị ahụ maka ha mara otu ihe nile ga-esi mee na njem ha. Ha banyere maka ha mụtarala ịtụkwasị-obi n’ime ike, omume-ọma, na ebere nke Onye-nwe-anyị, ma ha mgbe ahụ nọ na njikere inyefe onwe ha na obi-abụọ ọbụla ma-ọbụ ụjọ ha nwere n’aka Onye-nwe-anyị.

Mgbe adịghị-anya nwa-nwa anyị nwoke Abe nwere ụjọ ịgba otu nʼime anụmanụ nile carousel nke na agagharị elu na ala. Ọ họọrọ nke na-anaghị emegharị ahụ. Nne-nne ya na ikpeazụ kọwara ya na onweghị ihe ga-eme, ya mere, ịtụkwasị ya obi, ya banye. Mgbe ahụ o jiri ọnụ-ọchị sị, “E nweghị m obi ume-ala, kama enweghị m nsogbu.” Eleghị-anya otu ahụ ka ndị Jared dị. Ịtụkwasị Chineke obi nwere-ike bụrụ ihe anaghị enye obi ume-ala na mbido, kama ọńụ na-esota.

Abe nʼelu carousel ahụ

Njem ahụ adịghị mfe maka ndị Jared nile. “Enwere ọtụtụ oge eliri ha n’ime omimi nile nke oke osimiri ahụ, “n’ihi ugwuukwu nke mfegharịmmiri nile nke bịakwasịrị ha.” Kama e dere na “ikuku ahụ adịghị mgbe ọbụla ọ kwụsịrị ife [ha] chee iru ala ahụ e kwere na nkwa.” Dịka osiri-ike ịghọta, nke kachasị oge nile n’ime ndụ anyị mgbe ikuku nile siri-ike ma oke-osimiri dị-aghara, anyị nwere-ike nwete nkasị-obi na ịmara na Chineke n’ime ezi-omume Ya na e chee anyị iru ebe-obibi.

Ihe ahụ edere gara n’ihu, “Ma otu a ka anyagharịrị ha; ma ọdịghị ajọọ-anụmanụ nke osimiri nwere ike ịkụwa ha, ma-ọbụ nnukwu-anụ mmiri dị ka azụ nke nwere ike imebi ha; ma ha nwere ìhè esepụghị-aka, ma ọ bụ nʼelu mmiri ahụ ma-ọbụ nʼokpuru mmiri ahụ.” Anyị bi n’ime ụwa ebe mfegharị-mmiri nile nke ọnwụ, ọrịa, na nnwale na mkpagbu nile nke ụdị ọbụla n’adakwasị anyị. Mana, site na okwukwe n’ime Jizọs Kraịst na ịhọrọ ịtụkwasị Ya obi, anyị kwa nwere-ike nwee ihé esepụghị-aka ma ọbụ n’elu mmiri ma-ọbụ n’ime mmiri. Anyị nwere-ike inwe mmesị-obi ike na Chineke anaghị akwụsị ichee anyị iru ebe-obibi elu-igwe anyị.

Ka a na-atụgharị ha nime ụgbọ-mmiri nile, ndị-Jared “bụrụ abụ otuto nye Onye-nwe-anyị; … ma [ha] kelere ma too Onye-nwe-anyị ogologo ụbọchị ahụ nile; ma mgbe abalị bịara, ha akwụsịghị ito Onye-nwe-anyị.” Ha nwere ọńụ na inye-ekele ọbụnaghị n’ime etiti nke mkpagbu ha nile. Ha erutebeghị n’ala ahụ ekwere na nkwa, n’agbanyeghị ha nọọrọ n’ańụrị na ngọzi ekwere na nkwa n’ihi ntụkwasị obi ha nọgidere na adaghị-mba n’ime Ya.

Ndị Jared ka anyagharịrị nari ụbọchị atọ na iri-anọ na anọ n’elu mmiri ahụ. Ị nwere-ike tụgharịa-uche nye nke a? Ntụkwasị-obi n’ime Onye-nwe-anyị tinyere ịtụkwasị-obi n’ime oge Ya ma ọchọrọ ndidi na nnọgide nke na-anọkarị ebili-mmiri oke-ikuku nke ndụ.

Mgbe emechara, ndị-Jared “kwụsịrị nʼelu ikpere-mmiri nke ala ahụ e kwere na nkwa. Ma mgbe ha zọgideworo ụkwụ ha nʼelu ikpere-mmiri nile nke ala ahụ e kwere na nkwa ha kpọrọ isi ala nʼelu iru nke ala ahụ, na mere onwe ha umeala nʼiru Onye-nwe-anyị, ma bepụta anya-mmiri nke ọn̄ụ nʼiru Onye-nwe-anyị, n’ihi igwe nke ebere ya nile dị nro nʼarụ ha.”

Ọbụrụ na anyị nwee-okwukwe n’idobe ọgbụgba-ndụ anyị nile, anyị kwa ga otu ụbọchị rute na ebe-obibi anyị ma kpọọ isi n’ala n’iru Onye-nwe-anyị ma bepụta anya-mmiri nke ọńụ n’ihi igwe nke ebere Ya nile dị nrọ n’ime ndụ anyị, tinyere iru-uju nile nyere ohere maka ọńụ karịrị.

A na m agba-ama na dịka anyị nahọrọ ịtụkwasị-obi mgbe-ọbụla nadaghị-mba nime Jizọs Kraịst na nzube Ya nile dị-nsọ nime ndụ anyị, Ọ ga-eleta anyị jiri ikwe-nkwa nile, kwuo udo nye mkpụrụ-obi anyị nile, ma mee ka anyị “nwee olile-anya maka nnapụta anyị n’ime ya.”

A na m agba-aka-ebe na Jizọs bụ Kraịst ahụ. Ọ bụ ebe ọńụ niile si abịa. Amara Ya zuru-oke, ma Ọ bụ dike na nzọpụta. Ọ bụ ihé ahụ, ndụ ahụ, na olile-anya ahụ nke ụwa. Ọ gaghị ekwe ka anyị laa n’iyi. Site n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama nile

  1. Lee Alma 36:3; 57:27.

  2. Lee Alma 58:11.

  3. 2 Nifaị 2:23–25; okwu ugboro-ugboro ka agbakwunyere.

  4. Lee The Mathnawi of Jalalu’ddin Rumi (1925–40), trans. Reynold A. Nicholson, vol. 5, 132.

  5. Russell M. Nelson, “Ọńụ na Nlanarị nke Mụọ,” Liahona, Nov. 2016, 82.

  6. See Neal A. Maxwell, “Plow in Hope,” Liahona, July 2001, 73: “Redeeming Jesus also ‘poured out his soul unto death.’ … Dịka anyị mgbe ụfọdụ ‘n’awụpụ’ mkpụrụ-obi anyị nime arịrịọ onwe nile, anyị ghere-ọnụ, nwee ohere maka ọńụ!”

  7. Alma 31:38; lee kwa Neal A. Maxwell, “Brim with Joy” (Brigham Young University devotional, Jan. 23, 1996), speeches.byu.edu: “Mgbe anyị ruru ogo nke nnyefecha, mkpagbu anyị nile g’apụ n’ime ọńụ nke Kraịst. Ọ pụtaghị na anyị agaghị enwe mkpagbu nile, kama a ga-edobe ha n’ụdị ga-enye anyị ohere imeri ha. Dịka anyị nachọ ọńụ ma n’ebuli aka nke ezi-omume, anyị ga-enwe otu ntinye nke inwe-mmasị—otu ntinye soro ibeya—ruo, n’ime mkpụrụ-okwu nile nke onye-amụma, obi anyị nile ‘jubigara-oke n’ọńụ’ (Alma 26:11). N’ikpeazụ, iko nke mkpụrụ-obi ejufere!”

  8. Jọn16:33.

  9. Ita 1:42.

  10. Ita 2:18-19.

  11. Ita 2:22.

  12. Lee Jọn 8:12.

  13. Ita 2:19; tulee Mak 4:38; lee kwa Mak 4:35-41.

  14. Ita 2:25; okwu ugboro-ugboro ka agbakwunyere.

  15. Ita 3:4-5.

  16. Ita 6:4; okwu ugboro-ugboro ka agbakwunyere.

  17. Ita 6:6.

  18. Ita 6:8; okwu ugboro-ugboro agbakwunyere; lee kwa 1 Nịfaị 18:8

  19. Ita 6:10.

  20. Ita 6:9; lee kwa 1 Nịfaị 18:16.

  21. Tulee 1 Nifaị 5:5 Ka ọ nọ jii nʼime ọzara, Lehi nwere ọńụ n’ime ngọzi e kwere na nkwa.

  22. Lee Ita 6:11.

  23. Lee Hebrews 10:36; Alma 34:41; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 24:8; 64:32.

  24. Ita 6.12.

  25. Lee 1 Nephi 1:20; 8:8; Alma 33:16.

  26. Alma 58:11.

  27. Russell M. Nelson, “Ọńụ na Nlanarị nke Mụọ,” 82.

  28. Lee 2 Nịfaị 31:19; Alma 34:18; Moronaị 10:32.

  29. Lee “Kraịst Dị-ndụ: Ogbu-gba Ama nke ndị Ozi,” Liahona, Mee 2017, nime akwụkwọ mkpuchi dị nihu.

  30. Lee 1 Nifaị 1:14.