Ozi Kwa Ọnwa Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Ọgọst 2025
Onye Chineke Abụghị
Eziokwu 5 banyere Nna anyị nke Eluigwe
Anyị nwere ike mụta ọtụtụ ihe banyere onye Chineke bụ mgbe anyị ghọtara onye Ọ na-abụghị.
Ngosipụta sitere n’aka Camila Gray
Otu niime ngọzi kacha ukwuu nke Mweghachite bụ na Chineke ọzọkwa ekpughewo Onwe Ya na ejirimara Ya dị ka Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya. Mana mgbe ụfọdụ anyị nwere echiche ndị ọzọ banyere Chineke ndị na-abụghị nnọọ eziokwu. Mgbe nke a mere, anyị nwere ike mụta ọtụtụ ihe banyere onye Chineke bụ site na anyị ịghọta onye Ọ na-abụghị.
Chineke abụghị otu onye ana amaghị ama onye nọdụrụ nʻoche eze nʻebe dị oke anya.
Ọ bụ Nna anyị, ọ dị ịtụnaanya karịa nna ahụ nke ụwa onye ị chere bụ nna kachasị bụrụ onye ọma. Na-agbanyeghi na anyị enweghị ike icheta ndụ tupu ndụ anụ ahụ anyị na Ya, Ọ mazuru anyị nʻotu nʻotu nʻụzo zuru oke. Ọ nwere ahụ nwere anụ ahụ na ọkpụkpụ, ma anyị nọ nʻoyiyi Ya.
Ọ bụru na ị na-adọlị iche ihe Chineke dị ka ya, enwere ihe nlereanya zuru oke: Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst. Jizọs sịrị, “A bụ m ụzọ ahụ, eziokwu ahụ, na ndụ ahụ: ọ dighị onye ọbụla na-abịakwute Nna, ma ọ bụghị site na mụ. Ọ bụrụ na unu maara mụ na mbụ, unu ekwesiwo ịmatakwa Nna m” (Jọn 14:6–7) Ikwugharị nʻokwu ọzọ, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmata ihe Nna nke Eluigwe dị ka ya, anyị nwere ike mụta banyere ihe Jizọs Kraịst dị ka ya! Ha dị nʻotu nʻebumnuuche nʻụzọ zuru oke.
Chineke abụghị onye na-enweghi oge maka gị.
Nʻezie, ịnyere gị aka nwete ndụ ebighị ebi bụ ọrụ na ebube Ya. Ị bụ ihe mbụ Ya ọ lekwasịrị anya! Oge anaghị egbochi Ya otu o si egbochi anyị. Bịarute Ya nʻekpere nʻoge ọbụla. Emesịa gee ntị maka ụzọ niile O ji azaghachi.
Chineke abụghị onye na-amanye gị ka i soro Ya.
Okenye Dale G. Renlund nke Kworum NdịOzi Iri na Abụọ kuziri otu mgbe, “Ebumnuuche nke Nna anyị nke Eluigwe n’ụzọ ndị nne na nna si azụ ụmụ abụghị ime ka ụmụntakịrị mee ihe ziri ezi; ọ bụ ka ụmụntakịrị nwee ike họrọ ime ihe ziri ezi ma n’ikpeazụ dịrị ka Ya.” Ọ ga akpọku gị, nye gị ndụmọdụ, ma kuziere gị eziokwu, mana Ọ gaghị ewepụ ohere nhọrọ gị site nʻịmanye gị isoro Ya.
Chineke abụghị onye na-agba mbọ ijide gị mgbe ị na-eme ihe na-ezighị ezi ka Ọ nwee ike taa gị ahụhụ.
Kama, dị ka Okenye Patrick Kearon nke Kworum NdịOzi Iri na Abụọ kwuru, “Chineke nọ na-achụso gị akwụsịghị akwụsị,” pụtara na Ọ gaghị ma ọlị akwụsị ịgba mbọ ịnyere gị aka laghachikwuru Ya. Ọ maara na anyị niile garịrị ezute ihe isiike mgbe anyị mere njehie. Nʻihi ya Ọ rọpụtara ụzọ maka ime ka anyị dị ọcha site na mmehie ma chọta ume site nʻaja mgbaghara mmehie nke Ọkpara Ya.
Chineke abụghị onye na-echere ka anyị “zuo ezuo” ma ọ bụ “tozuo okè” tupu Ọ ga enwe ike hụ gị naanya.
Ịhụnaanya Ya maka gị enweghi ọgwụgwụ. Ọ hụrụ gị naanya ụgbu a, ọbụnadị otu isi etozughi okè! Onyeisi Jeffery R. Holland, Onyeisi Nnọchianya nke Kworum NdịOzi Iri na Abụọ, nyere nkọwa banyere eziokwu nke a nʻụzọ doro anya: ”Bịa dị ka ịdị,’ Nna nke dị ịhụnaanya na-agwa onye ọbụla niime anyị, mana Ọ na-agbakwụnye, ‘Mana achọkwala ị nọgide otu ahụ ịdị.’ Anyị na-ara ihu ọchị ma na-echeta na Chineke emewo mkpebi ime anyị karịa otu anyị si chee na anyị nwere ike ịbụ” Jiri ịhụnaanya na mgbam ume zuru oke, Nna nke Eluigwe na-agba mbọ ịnyere anyị aka ịdị ka Ya ma nata ihe niile Ọ nwere, otu nzọụkwu nʻotu oge.
Onye Chineke BỤ
Ụzọ kachasị mma iji mata Nna gị nke Eluigwe bụ ịganiihu na-enwete nhụmihe gị na Ya. Kedụ ka esi eme ya? Mụta banyere Ya na Ọkpara Ya site n’akwụkwọ nsọ na okwu niile nke ndị amụma dị ndụ. Kpee ekpere nye Ya. Debe iwu nsọ Ya niile. Gbuo oge dị jụụ na nke onwe gị naanị iji fee Ya na nzukọ nsọ, niime tempụl, ma nʻebe ndị ọzọ dị nsọ. Gbaa ma debe ọgbụgba ndụ gị na Ya. Ọ ga-enyere gị aka mata onye Ọ bụ na otu O si eche banyere gị.
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Ọgọst 2025. Igbo. 19616 593