“Ọhụ Nke Mbụ,” Friend, Jenụwarị 2025, 26–28.
Ozi Friend Kwa ọnwa, Jenụwarị 2025
Ọhụ nke Mbụ
I nwere ike ịgụ akụkọ nke a niime Agụgụala—Joseph Smith 1:1-20.
Mgbe Joseph Smit dị obere, ọtụtụ nzukọ nsọ kuziri ihe dị iche iche gbasara Jịzọs Kraịst. Joseph amaghị nzukọ nsọ nke ọ ga-esonye.
Otu ụbọchị, ọ gụrụ Jemis 1:5 niime Baịbụl. O kwuru ọ bụrụ na anyị chọọ amamiihe, anyị nwere ike ịrịọ Chineke. Joseph kpebiri ime nke ahụ.
N’otu ọmarịcha ụbọchị oge udu mmiri, Joseph banyere nime ọhịa iji kpeere Nna nke Eluigwe ekpere.
Joseph gbisara ma malite ikpe ekpere. Mana mgbe ahụ ọ dịrị ya ka ọchịchịrị gbara ya gburu gburu. Egwu tụrụ Joseph. Ọ rịọrọ Chineke maka enyemaka.
Na mberede, Joseph hụrụ ihe nke si n’eluigwe na-agbadata. Ọ hụrụ Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst kwụ ọtọ n’ikuku. Nna nke Eluigwe kpọrọ aha nke Joseph. Mgbe ahụ Ọ tụrụ Jizọs Kraịst aka ma sị, “Onye a bụ Ọkpara M Hụrụ Naanya. Nụrụ Ya!”
Jizọs gwara Joseph ka ọ ghara ịsonye nzukọ nsọ nke ọbụla.
Joseph ga-enye aka weghachite uju nke ozi ọma n’ụwa.
Joseph enwekwaghị mgbagwoju anya ọzọ. Obi jupụtara ya n’ọńụ! Ọ maara na Chineke hụrụ ya n’anya. Ụfọdụ ndị ekwenyeghị na ọ hụwo Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst, mana ọ maara na ọ bụ eziokwu.
Ihu akwụkwọ A na-ete agba
Nna nke Eluigwe Na-anụ ma Na-aza ekpere M niile
Ngosipụta sitere n’aka Corey Egbert
Nna nke Eluigwe zara ekpere nke Joseph Smith. Ọ ga-azakwa nke gị!
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend kwa Ọnwa, Jenụwarị 2025. Igbo. 19632 593