12. Ogige Ubi Getsemane
Foto nke a nke osisi olive meworo agadi ka e sere n’ebe ọdịnala nke Ogige Ubi Getsemane. Onye-nzọpụta kpere ekpere na nso ebe a mgbe ọ hapụsịrị ime-ụlọ dị n’elu n’abalị nke a raara ya nye.
Ihe Omume nile dị Mkpa: N’ebea ka Jisus Kraịst malitere ịta ahụhụ n’ihi mmehie nile nke mmadụ nile (Mat. 26:36–44; Mak 14:32–41; OznỌd. 19:16–19). Na-isochi ekpere ya Judas Iskarịọt raara ya nye, na ndị na-eso ụzọ ya gbanarịrị ya otu oge-na-isochi njide ejidere ya n’ime ogige ubi ahụ (Mak 14:50). (Hụ Nduzi gaa n’Akwụkwọ-nsọ nile, “Getsemane”.)
12. Ogige Ubi Getsemane Osisi olive nile mgbe ochie nwere ike bụrụ na ha gbadatara site na ndị nke ahụ dị n’ime ogige ubi ahụ ebe Onye-nzọpụta kpere ekpere na mkpụrụ ọsụsọ nke ọbara pụtara ya n’arụ mgbe ọ na-amalite aja mgbaghara mmehie ahụ.