Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Eprel 2026
Mgbe Mmejọ Gị niile Gasịrị—Ọbụna Ndị nke Buru ibu
Anyị pụrụ ịmụta ọtụtụ ihe site nʻaka Pita gbasara Onye Nzọpụta, Aja mgbaghara mmehie Ya, na ịnwakwa ọzọ.
Ngọnarị nke Pita, site nʻaka Carl Bloch
Ọtụtụ niime anyị emewo opekampe otu ihe ncheta nke anyị nwere ike nnọọ chefuo. Ma ọ bụ na ọ bụ oge imechuihu doro anya, otu ihemberede ahụ oke mgbu, ma ọ bụ ịrụ ụka mgbe ikwuru okwu niile ndị imechara kwaa mmakwaara, enwere ọtụtụ oge niime ndụ mgbe "mefere" ma ọbụladị "hichapụ" ụda ọdụmbi na-adakarịcha ụda na-adọ oke akpịrị.
Otu Amụma Dị ilu Emejuputara
Onyeozi Pita bụụrụ onye na-adọrọ mmasị niime Agba Ọhụrụ. O nwere okwukwe na mgbam ume ije ije nʻelu mmiri gakwuru Jizọs, mana naanị obere oge sotere o kwere ka egwu ya merie ya ma ya amalite imikpu, na-etiku Onyenwe anyị maka enyemaka (lee Matthew 14:28-31 ). Ebe anyị na-amaghị uju niile banyere ndụ nke Pita, anyị maara otu oge mgbe o bere akwa dị egwu.
Naanị ọtụtụ awa tupu anwụchie Jizọs Kraịst, O buru amụma na Pita ga-agọnarị Ya ugboro atọ tupu oke ọkpa ebee ugboro abụọ. Pita jụrụ ịnabata ụdịrị amụma dị otu ahụ ma "kwuo kwa hoo haa, ọ bụrụ na m ga-eso gị nwụọ, agaghịm agọnarị gị nʻụzọ ọbụla" ( Mak 14:31 ).
Nʻezie, amụma nke Onye Nzọpụta mechara bụrụ eziokwu. Site nʻihe egwu na ụjọ gbara mnwuchi nke Onye Nzọpụta gburugburu, akpamike nke Pita gbanahụrụ ya. Ka ọ gọnasịworo ugboro abụọ na ya amaghị Onye Nzọpụta, ma ebe a jụrụ ya nke ugboro atọ, Pita "malitere ịba mba na ịn̄ụ iyi, na-asị, amaghị m onye nwoke a unu na-ekwu maka ya bụ" (Mak 14:71 ).
Mgbe oke ọkpa bere ugboro abụọ ma Pita chetara amụma nke Onye Nzọpụta, "o … bere akwa dị egwu" (Matiu 26:75).
Mana nke ahụ abụghị ebe akụkọ ya kwụsịrị!
Otu Nkọnkọ Tụgharịrị, Ruo ebighị ebi
Site niihe niile anyi nwere ike ịmuta niime akwụkwọ nsọ, ụjọ nke Pita emerighị ama ya banyere Jizọs Kraịst ọzọ. Ọ gbara ama na-atụghị egwu banyere Onye Nzọpụta na ohere ọbụla o nwere, na-agbanyeghị ọghọm chere ya niihu na-ime otu ahụ. Chetakwa, Pita naara akuziri ndị nke ka kpọgburu Jizọs Kraịst! Ihe egwu ahụ bụ eziokwu.
Mgbe Pita gwọrọ nwoke mkpọnwụ ahụ kemgbe amụrụ ya, na-enye ya iwu, "Nʻaha Jizọs Kraịst nke Nazaret kulie ma jee ije" (Ọrụ 3:6), a nwuchiri ya na Jọn ma jụọ ya ajụjụ otu o siri rụọ ọrụ ebube nke a.
Pita zara na-atụghị egwu, "Unu niile mata, ma nye ndị nke Izrel niile, na site nʻaha Jizọs Kraịst nke Nazaret, onye unu kpọgbuworo, onye Chineke kpọlitere site na ndi nwụrụ anwụ, ọbụna site na ya ka nwoke a si guzoro ebe a niihu unu nʻahụ ike.
"Nke a bụ nkume ahụ nke ndị na-ewu ụlọ na-enweghị ihe ha ji ya kpọrọ, nke na-aghọwo isi nkọnkọ ụlọ. Ọ bụghị ma enwere nzọpụta nʻụzọ ọbụla ọzọ: niihi na enweghị aha ọzọ nọ nʻokpuru eluigwe enyere nʻetiti ụmụ mmadụ, nke aga esirịrị na ya azọpụta anyị" (Ọrụ 4:10-12).
Lee ọsịsa enyere na-atụghị egwu! Ma aka ebe doro anya nke nkwenye ya niile.
Ụmụ odibo Na-ezughị okè, Zuruokè nʻụzọ niile Ije ozi
Onye ọbụla niime anyị na-aga ime mmehie niime ndụ nke a. Na-agbanyeghị mbọ anyị kachasị mma, anyị na-aga ada na olileanya na nzube anyị niile site nʻoge ruo nʻoge. Dị ka Onyeisi Jeffrey R. Holland (1940-2025), Onyeisi nke Kworum Ndịozi Iri na abụọ, kuziri otu mgbe, "Ewezuga nʻọnọdụ nke naanị Ọkpara Ọ Mụrụ naanị ya zuruokè, ndị niile na-ezughị okè bụ ndị Chineke nweworo iji rụọ ọrụ."
Uru nke ime mmụọ gị abụghị ihe a na-ekpebi ma ọ bụ nke mmejọ gị niile na-egbochi—ọbụna ndị dị ukwuu! Niihi na o chegharịrị ma Kraịst agbaghara ya, ngọnarị nke Pita banyere Kraịst egbochighị ya site na imecha ịgba ama, ikuzi nkuzi, na ime ntọghata site nʻike dị ukwuu. Akwụkwọ nsọ niile juputara na ọmụmaatụ niile nke ndị na-eso ụzọ ndị ọzọ ndị mehiere, chegharịa, ma gaaniihu na-inwe okwukwe na kraịst.
Setan mgbe niile ga na-agba mbọ ime ka ikwenye na mmejọ gị niile na--abawanye ma na ịgaghị enwe ike imeri ha. An̄akwala ntị na-ụgha ya niile!
Nwanne nwanyị Tamara W. Runịa, Onye ndụmọdụ nke Mbụ niime Otù Ndịisi Zuru ọha Ndịinyom Nta, kuziri: "Unu kwesịrị ịnụ nke a, ya mere aga m ekwuputa okwu niile ndị a ịda ụda: Unu abụghị olu ahụ na-ada nʻisi unu ma ọ bụ mmejọ niile ndị unu na-emewo. Unu nwekwara ike ikwuputa nke ahụ ka anụkwa ya anụ. Gwa Setan, ʻỌbụghị Taa.ʻ Tifee ya na-azụ gị.
"Nwee mmetụta ọdịdọ ahụ, mwute nʻụzọ chukwu nke na-echigharị gị chewe ihu nʻebeOnye Nzọpụta gị nọ, ma na-ele ka amara Ya na--abata niime ndụ gị na ndụ niile nke ndị ahụ ị hụrụnaanya. Ana m ekwe nkwa na oge ahụ anyị kpọtara onye obi tiwara etiwa na-ebe Ọ nọ na-ātụghị egwu, Ọ nọ ebe ahụ ozugbo ozugbo."
Christus Consolator, site nʻaka Carl Bloch
Ụbọchị Gị niile Ndị Mara Mma Nọ Niihu
Oge Ista nke a, dị ka ị na--atụgharị uche nʻuju na Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta, cheta na ike iji chegharia ma nwaa ọzọ bụ otu niime onyinye ndị kachasị ukwuu i nwere ike ịnata. Niihi Jizọs Kraịst, mmejọ gị niile ndị jọgburu onwe ya nwere ike nata mgbaghara ma achịfuo ha dị ka ụdọ igwe dị arụ.
“Onye Nzọpụta mgbe niile ebighị ebi bụ ihè karịa ọchịchịrị nke ihere," Nwanne nwanyi Runịa akụziwo.
Niihi Jizọs Kraịst, olileanya nwere ike mgbe niile chakee nke ọma niihu dị ka ị na-elekwasị Ya anya.
© 2026 site n’áka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Eprel 2026. Asụsụ. 20064 593