Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Maachị 2026
Ọpụpụ 12
Emume Ngabiga Anyị—Oriri nsọ ahụ
Enwere njikọ nkịtị nʻetiti Emume ngabiga mgbe gboo ya na oriri nsọ anyị kwa izu.
Ngosịpụta site n’aka Alyssa Tallent
Tupu Ndị Izrel mgbe gboo nwetere ike ịhapụ ịgba ohu ha niime Ijipt, agwara ha irube isi na nkuzi kpọm kwem niile sitere na Onyenwe anyị ka mmụọ ozi mbibi ga-ahapụ ha, ma ọ bụ gafee ha (lee Ọpụpụ 12). Mgbe ha hapụrụ Ijipt, Ndị Izrel mere erimeri afọ ọbụla, akpọrọ Emume ngabiga, iji cheta otu Onyenwe anyị siri napụta ndị Ya gbara ndụ.
Mgbe izu ụka ikpeazụ nke ndụ anụ ahụ Ya, Jizọs Kraịst nọ na nri Emume ngabiga. Ugbu a anyị na-akpọ nri ahụ Nri Anyasị Ikpeazụ. Onye Nzọpụta jiri emume ahụ iji nabata emume nsọ nke oriri nsọ, nke anyị na-esonye izu ụka niile. (Lee Matiu 26:26–28; Luk 22:19–20; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77, 79.)
Ebe a bụ njikọ nkịtị abụọ dị nʻetiti Emume ngabiga nke mbụ, Nri Anyasị Ikpeazụ nke Onyenwe anyị, na oriri nsọ nke taa nwere ike inyere anyị aka cheta nnapụta anyị site nʻaka Onye Nzọpụta.
Achịcha
Emume ngabiga: Ruo mkpụrụ ụbọchị asaa, Ndị Izrel riri achicha nʻekoghị eko (nke a na-eme ngwa ngwa ma adịghị mfe ịma evu ma ree).
Nri Anyasị Ikpeazụ: Jizọs Kraịst gọziri ma yawaa achicha nʻekoghị eko nke Emume ngabiga, ma nye ya ndị na-eso ụzọ Ya Ọ gwara ha iri ya na ncheta nke ahụ Ya, nke Ọ maara ga-agbaji ma ga-anwụ mgbe na-adịghị anya mana ga-ebilite ọzọ.
Oriri nsọ: Anyị na-eri achịcha na ncheta nke ahụ nke Jizọs Kraịst.
Jizọs Kraịst bụ Achịcha nke Ndụ. Site na Mbilite nʻọnwụ Ya, anyị ga-ebilite nʻọnwụ jiri ahụ zuru oke, na-apụghị ire ure, na-apụghị ịnwụ anwụ. Ọ na-anapụta anyị site nʻọnwụ.
Ọbara nke Nwa atụrụ ahụ.
Emume ngabiga: Nwa atụrụ Emume ngabiga bụ oke nwa atụrụ, na-enweghị ntụpọ gbara otu afọ. E gburu ya, ma ọbara ya ka aga awụnye niime efere. Hyssop (ọgwụ mgbọrọgwụ) ka aga etinye niime efere ahụ ma jiri ya fesaa nakụkụ ahụ ọnụ ụzọ dị nʻezi. Nke a bụ ịrịba ama ahụrụ anya nʻegosịpụta ndị ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị ka mmụọ ozi mbibi gafee ha ka ewee nwee ike napụta ha site nʻịgba ohu niime Ijipt.
Nri Anyasị Ikpeazụ: Jizọs Kraịst jiri mmanya iji nọchite ọbara Ya. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ Ya ịn̄ụ ya na ncheta nke ọbara Ya, nke akwafuru maka mgbaghara mmehie niile na dị ka akụkụ nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ.
Oriri nsọ: Anyị na-an̄ụ mmiri na ncheta nke ọbara nke Jizọs Kraịst.
Jizọs Kraịst bụ Nwa atụrụ nke Chineke. Ọbara Ya ka akwafuru dị ka Ọ tara ahụhụ maka mmehie anyị na adịghị ike anyị niile. Ọbara Ya—aja Ya—na-asachapụ anyị. Ọ na-anapụta anyị site na mmehie.
© 2026 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Maachị 2026. Igbo. 19936 593