Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa
Ị Chọrọ Inwe Ọn̄ụ karịa? Nwaa Obi ekele
Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Febrụwarị 2026


Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Febrụwarị 2026

Ị Chọrọ Inwe Ọn̄ụ karịa? Nwaa Obi ekele

Mgbe ndụ gị juputara na mgbanwe, obi ekele nwere ike inyere gị aka tinye uche niihe dị mma ma nọgide na-inwe olileanya.

otu onye mmiri oruru kpugidere na otu onye nke ụmụ nnụnụ na urughubụba na okoko osisi gbara gburugburu

Ngosipụta niile site nʻaka Maggie Stephenson

I nweghị ike enwe obi ọma karịa ka i nwere obi ekele.”

Dị nnọọ ka nn̄omi nke a sitere nʻaka Gary B. Sabin nke ndị Iri asaa tụpụtara, ka i si nwee obi ụtọ bụ kpọmkwem ka obi ekele gị si akpalite. Ọ bara uru—mgbe i nwere obi ekele, ị na-etinye uche nʻihe ndị dị mma kama nʻihe ndị jọrọ njọ.

Dị ka ọ dị, ndụ anaghị aga ka e si chee mgbe niile. Mgbanwe ndị na-atụghịanya nwere ike mee gị enwekwuo nchekasị, obi ọjọọ, ma ọ bụ nkụda mmụọ karịa obi ụtọ. Mana mgbe ihe niile rara ahụ, obi ekele nwere ike inyere gị aka nwee olileanya. Nwaa ụzọ atọ ndị a iwetekwu obi ekele na ndụ gị.

1. Leba anya niihe Dị mma

Ọtụtụ mgbe, ọ na-akacha ara ahụ inwe obi ekele mgbe i chere na o nwere ihe kọrọ gị. Mana olee ngọzi ndị i nwere ike na-eleghara anya site na-itinye uche niihe ndị i nweghị karịa niihe ndị i nwere enwe?

Dị ka ịna achọgharị ihe ndị dị mma niime ndụ gị, ka oge na-aga ọ ga-aka adị mfe ịchọta.

2. Kelee Onye Na-enye enye

Mgbe ị gụgharịrị ngọzi gị niile, echefukwala ebe ha siri bịa.

Ikele Nna nke Eluigwe maka onyinye Ya niile—tinyere onyinye nke Ọkpara Ya—nwere ike ime ka ịhụnaanya na okwukwe gị niime Ya dị omimi karịa. Onyeisi D. Todd Christofferson, Onye ndụmọdụ Nke abụọ n’Otù Ndịisi Mbụ, kọwakwara, “Inwe mmetụta na ikwuputa ekele nye Chineke … na-etinye echiche nke mmegharị ọn̄ụ ọhụrụ niime ofufe,” na-ewetere an̄ụrị na ume ma na-enyere ama gị aka inwe nchekwa.

Lekwasị anya nʻelu Atụmatụ Nna nke Eluigwe

Nke doro anya, inwe obi ekele apụtaghị ịgbachi ihe isi ike niile nke ndụ nkịtị ma ọ bụ inwe obi ụtọ oge niile. Ọbụna Jizọs Kraịst nwere mmetụta mgbu ma nakwere ya (lee Alma 7:11; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 19:18–19). Inwe obi ọjọọ bụ mpaghara ndụ anụ ahụ dị irè.

Mana na-agbanyeghị ihe ọbụla, otu ihe na-enweghị ike ịgbanwe: Atụmatụ ebere nke Nna nke Eluigwe. Obi ọjọọ niile na mmegbu niile i nwetere na ndụ ka aga emezi niihi Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya (lee Mkpughe 21:4).

Okenye Dieter F. Uchtdorf nke kworum Ndịozi Iri na abụọ kọwara: “Na-inwe obi ekele nʻoge mkpagbu apụtaghị na ọnọdụ anyị dị anyị mma nʻobi. Ọ pụtara na site naanya nke okwukwe anyị na-ahụ gafee ihe aka mgba ndị anyị nwere ugbu a.”