Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Ọktoba 2025
Gịnị kpatara Onyenwe anyị jiri nwee Nzukọ nsọ?
Ebumnuche nke Nzukọ nsọ nke Kraịst bụ “inye ndị mmadụ na ndị ezi na ụlọ ike iji nyere Chineke aka na-imezu ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu Ya.” Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a na-enye aka “ime ka ụmụ [nke Chineke] tozuo okè maka ogo otuto ahụ kachasị elu, nke bụ mbuli elu ma ọbụ ndụ ebighị ebi.”
“Onye Nzọpụta … enyewo [Nzukọ nsọ] ikike iji mejuputa ebumnuuche Ya niile—ikwusa ozi ọma Ya, na-enye emume nsọ Ya niile na ọgbụgba ndụ Ya niile, ma na-eme ya ekwe omume maka ike Ya iji gbaghara ma doo anyị nsọ.”
Ndị otù Nzukọ nsọ nwere ohere ịnata ike na ngọzi niile nke Jizọs Kraịst site na ikike na ntụghe niile nke ọkwa nchụaja, ọgbụgba ndụ na emume nsọ niile, nduzi onye amụma, akwụkwọ nsọ niile na ọgbakọ nke Ndị nsọ.
Enyewokwa Nzukọ nsọ iwu: “Kulie ma mụkee, ka ìhè gị bụrụ ọkọlọtọ maka mba niile” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 115:5).
Ndị otù Nzukọ nsọ na-agba mbọ “ịmụke” site na-ibi ndụ ozi ọma, ịkpọku onye niile ka ha nata ozi ọma ahụ, ịme ka ezi na ụlọ dịrị nʻotu ruo mgbe ebighị ebi, na ịlekọta ndị dara ogbenye na ndị nwere mkpa. Nke a bụ ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu nke Chineke.
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Ọktoba 2025. Igbo. 19624 593