Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Septemba 2025
Jizọs Kraịst Bụ maka Ụbọchị Ndị ọma ahụ Kwa
Mgbe ihe niile na-aga nke ọma, kedụ otu anyị nwere ike iji lekwasị anya na Onye Nzọpụta? Nke a bụ ụfọdụ nchepụta.
Chee ọ bụrụ ma otu enyi na a nọnyere gị naanị mgbe ha na-adọlị ma zere gị mgbe ha na-enwe obi ụtọ. Ọ bụ Mmekọrịta Dị mma? Ọ bụghị nʻezie.
Anyi ọ na-akpasịkarị Onye Nzọpụta anyị ụdị agwa ahụ—na-achọ Ya nʻoge ndị ihe siri ike ma chefuo Ya nʻoge ndị ihe dị mma?
Anyị na-ekwukarị ọtụtụ ihe banyere otu Jizọs Kraịst si enyere anyị aka site nʻoge ndị ihe siri anyị ike, ikekwe niihi na onye ọbụla, nʻotu mgbe ma ọ bụ ọzọ, na-ezute ihe ndị siri ike.
Mana enwere ụfọdụ ụbọchị—ọtụtụ izu ụka ma ọbụna afọ—ọ bụrụ ma anyị nwee ihu ọma—mgbe ihe niile na-aga nke ọma nʻezie. Mgbe ụfọdụ anyị na-echefu Onye Nzọpụta nʻoge ndị ahụ. Ndị dị iche iche nke Akwụkwọ nke Mọmọn chefuru. Ha mere nke ọma site na ngọzi niile nke Chineke nwa oge nta mana nʻikpeazụ daba na mpako mgbe ha chefuru Ya.
Oge ndị ihe dị mma apụtaghị na anyị ozugbo enwezighị mkpa Jizọs Kraịst ọzọ. Oge ime nke ọma bụ oge ndị zuru oke iji n̄ụrịa ọn̄ụ anyị na Onye Nzọpụta, ọbụghị ichefu Ya.
Ya mere kedụ otu anyị ga-esi anọgige na njikọta anyị na Jizọs Kraịst na Nna anyị nọ nʻEluigwe mgbe mnwale na-anaghị echetere anyị ichigharịkwute Ha?
Nwee Umeala
Mgbe ụmụ ihe na-aga nke ọma, ọ dị mma ịn̄ụrị ọn̄ụ na ngọzi gị niile na ihe ndị imezuru. Mana echefukwala onye mere o ji kwe omume maka gị ịnọ ebe ị nọ. Eze Benjamin kwuru ya nʻụzọ dị otu a nʻokwuchukwu ya dị niime Akwụkwọ nke Mọmọn:
“Niihi na lee, ọ bụ na anyị niile abụghị ndị arịrịọ? Ọ bụ na anyị niile anaghị adabere n’otu Onye ahụ dị, ọbụna Chineke, maka ihe niile nke anyị nwere, maka ma ihe oriri na uwe, na maka ọlaedo, na maka ọlaọcha, na maka akụ na ụba niile nke anyị nwere n’ụdị ọbụla?” (Mozaya 4:19).
Ịdị umeala banyere ọganiihu gị site nʻicheta ihe Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst mewooro gị bụ nnukwu ụzọ iji tinye Ha nʻoge niile ihe dịịrị gị mma.
Nwee Obi Ekele
Afọ ojuju bụ otu niime ajụire kachasị mma nye mpako na nchefu. Ị na-ekele Chineke ga-enyere gị aka cheta Ya ya na ihe niile dị mma Ya na Ọkpara Ya na-eme na ndụ gị. Nke a dịkwa irè nʻoge ndị ihe dị mma dịkwa ka nʻoge ndị ihe siri ike.
Kpachara Anya
Otu niime mbuso agha kacha masị Setan bụ “ịgụgọ, ma dufuo [gị] baa niime nchekwa nke anụ ahụ” (2 Nefi 28:21). Ikwu ya nʻụzọ ọzọ, ọ ga-amasị ya ọ bụrụ ma gị nwee afọ ojuju ma nwee nchekwa nʻoge ihe niile dịịrị gị mma nke mere na ị echefuru ihe ndị kacha dị mkpa. Ya mere, echefukwala Chineke! Mgbe ị kpachara anya maka aghụghọ niile nke onye iro ma guzogide ha ọbụna nʻoge ihe ndị dịịrị gị mma, i nwere ike nọdebe Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst nso.
Onye ọzụzụ atụrụ Ọma, site n’aka Michael Malm
Dabere Sie ike na Kraịst
Onyeisi Russell M. Nelson kuziri: “Mgbe nlekwasị anya nke ndụ anyị dabeere n’atụmatụ nke nzọpụta nke Chineke … na Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya, anyị nwere ike nwee mmetụta ọn̄ụ na-agbanyeghị ihe na-eme—ma ọ bụ na-anaghị eme—niime ndụ anyị. Ọn̄ụ na-abịa site na ma niihi Ya. Ọ bụ nsipụta nke ọn̄ụ niile.”
Ugboro ole ka i na-eche maka eziokwu nke a banyere ọn̄ụ mgbe ndụ na-aga nke ọma? Nke a abụghị naanị ndụmọdụ na-akasị obi maka mgbe ụmụ ihe siri ike. Ọ bụ eziokwu mgbe niile, gụnyere ụbọchị gị ndị kachasị mma. Ya mere mee ihe niile i nwere ike iji lekwasị anya na Kraịst, ma ọ dị ọjọọ ma ọ dị mma.
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Septemba 2025. Igbo. 19626 593