Ozi Kwa Ọnwa Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Maachị 2025
Kedụ otu anyị ga-esi ebi niime ụwa ma “tọgbọ ihe niile nke ụwa nke a iche”?
Ndị Na-eso ụzọ Ọ Họworo, site n’aka Casey Childs
Onyenwe anyị ekwuwo “Ị ga-atọgbọ iche ihe nile nke ụwa nke a, ma chọọ ihe ndị kacha mma” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:10). Nke a apụtaghị na anyị ga-eleghara anya mkpa nke nwa oge nta anyị na ihe ndị na-akpa anyị, kama ọ pụtara na anyị agaghị etinye obi anƴi na akụ nʻụba, ike, ọnọdụ, ma ọ bụ nkwado nke ndị ụwa. Ndị a bụ ụfọdụ ụkpụrụ nke akuziworo anyị banyere ibi ndụ nʻụwa:
Were ihe ndị nke Chineke kporo ihu. “Burunụ ụzọ chọọ alaeze na Chineke, na ezi omume ya” (Matiu 6:33). Nime obi anyị na ndụ anyị, iwu nsọ niile nke Chineke na ọgbụgba ndụ niile anyị na Ya bụ ihe kacha anyị mkpa.
Chọọ Mmụta ihe. “Dị ka ị na-amụta banyere ụwa nọ gị gburugburu, mụtakwa banyere Onye nzọpụta. … Dị ka ị na-amụtakwu ihe, mgbe ahụ ka ị ga aka enwe ike iwulite alaeze nke Chineke ma metụta ụwa maka ọdị mma” (Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ niile [2022], 31, 32).
Ọrụ “Ọrụ bụ ụkpụrụ dị mkpa nke ozi ọma. “Ọ na-eme ka enwe uto ma na-emelite anyị. … Onyenwe anyị achọghị nanị kʻanyị rọpụta ihe maka ezi na ụlọ anyị niile mana ị ʻnọrọ n’oke agụụ na-ịchụso ihe ọmaʻ [Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:27]” (“Inye Ọrụ,” Isiokwu niile na Ajụjụ niile, Ọba akwụkwọ Ozi ọma).
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Maachị 2025. Igbo. 19628 593