2025
Enyem aka sitere n’Ebe Zuru oke
Febrụwarị 2025


Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Febrụwarị 2025

Enyem aka sitere nʻỤzọ Zuru oke

Na-agbanyeghị nsogbu ndị na-akpagbu unu, Jizọs Kraist ga-enyere unu aka dị ka unu n’abịakwute Ya.

Jizọs Kraịst

Nsoro Ahụ, nke si n’aka Jeanette Bourup

Otu oge ma ọ bụ mgbe ọzọ anyị niile chọrọ obere enyem aka. Mgbe ụfọdụ ọtụtụ enyem aka. Nke bụ eziokwu bụ, ndụ na-adịkarị mma nke ukwuu mgbe na-ịnwaghị anwa ịga ya naanị gị.

Jizọs Kraịst bụ isi nke enyem aka, olileanya, na ume gị. O nwekwara ike nye aka gbanwee gị ịdị mma karịa—ikekwe ọbụna nʻụzọ ndị icheghị ga-ekwe omume.

Mgbanwe nke Obi

O nwewo mgbe i kpere ekpere ka Chineke mee ka obi ndị iro gị dị nro? Ọ bụrụ otu a, ị nọ n’ezigbo otụ̀ (lee 3 Nefi 12:44; Moronaị 7:48). Ọ bụrugodu na inweghị ndị iro n’uche nke Akwụkwọ nke Mọmọn ahụkwa (ị maara, ndị iro ejikwara na ngwa agha niile ma dị njikere ibu agha), inwere ike ikpewo ekpere na Chineke ga-eme ka obi nke onye nke na-anaghị emeso gị omume ọma dị nro.

Mana enwetuwo mgbe i chere ikpe ekpere ma rịọ Chineke ka o mee ka obi gị dị nro? Ikekwe ọ na-ara gị ahụ ịgbaghara mmadụ. Ma ọ bụ ị na-anọgide na-iwe iwe, ọbụladị na ịchọghị. Ma ọ bụ ị ga-achọ inweta mmetụta obi ebere na-ebe ụmụnne gị nọ karịa na-agbanyeghị nke bụ eziokwu na ha na-akpasu gị iwe mgbe ụfọdụ.

“[Jizọs Kraịst] ga agbanwe obi gị na ndụ gị. Obere obere, ị ga-eto ma bịa dị ka Ya karịa. Njikọ ọgbụgba ndụ gị na Ya ga-ewetara gị nnukwu ohere nye ike Ya” (Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ niile [2022], 8, nkwusi ike agbakwunyere).

Ọ bụ na nke ahụ abụghị nkwa dị ukwuu? Na-agbanyeghị ihe na-ara gị ahụ, ọbụna obi nke gị onwe gị, Jizọs Kraịst nwere ike inye aka. Kedụ otu ị ga-esi agakwuru Ya taa?

nwata nwoke