Friend
Emume Ngabiga Ahụ
Friend Eprel 2026


"Emume Ngabiga ahụ," Friend, Epr. 2026, 46-48

Ozi Friend ahụ Kwa ọnwa, Eprel 2026

Emume Ngabiga Ahụ

Ngosịpụta nke Mosis na Erọn na-agwa Fero okwu

Mosis gakwuuru Fero ma rịọ ya ka o mee ka ndị Izrel nwere onwe ha site n’ohu. Fero jụrụ ajụ. Onyenwe anyị zigara ọpịpịa niile na Ijipt, mana Fero ka jụkwara ajụ.

Ngosịpụta banyere Mosis na-agwa ndị mmadụ okwu

Onyenwe anyị kwuru na Ya ga-ezite otu ọpịpịa ikpeazụ. Nwa mbụ nke ezi na ụlọ ọbụla na Ijipt ga-anwụ. Mana ọ bụrụ na ụmụ Izrel gbasoro ntuziaka Ya niIle, ọpịpịa ahụ ga--agafe ha.

Ngosịpụta nke otu nwoke na-ete ibo ụzọ agba, ya na ụmụntakịrị na-eleanya

Onyenwe anyị gwara ụmụ Izrel ka ha were otu oke nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ chụọ aja ma tee ọbara nke nwa atụrụ ahụ nʻelu ụzọ ha.

Ngosịpụta nke Fero na-eru uju nwa ya nwoke nwụrụ anwụ

Ọpịpịa ahụ bịara. Ụmụ mbụ niile ndị Ijipt mụrụ nwụrụ, gụnyere nwa Fero nke nwoke. Mana ụmụ mbụ nke ụmụ Izrel ka azọpụtara niihi na ha rubeere Onyenwe anyị isi.

Ngosịpụta nke Fero na-ewe iwe na-ezipụ ndị agha

Fero gwara Mosis na ụmụ Izrel ka ha hapụ Ijipt. Mana Fero were iwe. Ya na ndị agha ya chụsoro ha.

Ngosịpụta nke ụmụ Izrel ndị agha na-achụ ọsọ

Ụmụ Izrel gbakọrọ nʻOke osimiri Uhie. Mgbe ha hụrụ ka ndị Ijipt na-abịa, ụjọ tụrụ ha. Mosis kwuru na Onyenwe anyị ga-echekwa ha.

Ngosịpụta nke Mosis na-ekewa Oke osimiri Uhie

Mosis buliri mkpara ya, ma Onyenwe anyị kewara oke osimiri ahụ. Ụmụ Izrel kufere nʻala akọrọ.

Ngosịpụta nke Oke osimiri Uhie na-adakwasị ndị agha ndị Ijipt

Mgbe ụmụ Izrel nwere nchekwa nʻakụkụ nke ọzọ nke oke osimiri ahụ, mmiri ahụ gbadatara ma rie ndị agha ahụ. Ụmụ Izrel nweere onwe ha nʻikpeazụ.

Ihuakwụkwọ a na-ete agba

Jizọs Kraịst bilitere n’ọnwụ niihi m.

ihuakwụkwọ a na-ete agba PDF nke ili Onye Nzọpụta ghere oghe

Ngosịpụta site nʻaka Audrey Day. Enwere ike ịkọpị maka naanị iji eme ihe na Nzukọ nsọ.

Gịnị ka i nwere ike ime iji cheta Jizọs Kraịst na Ista nke a na nʻafọ niile?