“Mosis Onye amụma,” Friend, Maachị 2026, 46–48.
Ozi Friend Kwa Ọnwa, Maachị 2026
Mosis Onye amụma
Mosis bụ Onye Izrel, mana a zụrụ ya site naka nwa ada Fero niime Ijipt. Obi jọrọ Mosis njọ na Ndị Ijipt nwere obi ọjọọ nʻebe Ndị Izrel nọ ma mee ha ndị ohu ha.
Otu ụbọchị Mosis hụrụ otu Onye Ijipt na-akụ Onye Izrel ihe. Mosis chedoro Onye Izrel.
Mgbe Fero chọpụtara, ọ naara achọ igbu Mosis, mana Mosis gbapụrụ site na Ijipt.
Mosis bịarutere nebe a na-akpọ Midian, ebe o zutere otu nwanyị akpọrọ Zipporah. Ha lụrụ di na nwunye ma mụọ ụmụ.
Mgbe o bi niime Midian, Mosis hụrụ ọhịa na-ere ọkụ, mana ọkụ ahụ erechapụghị ọhịa. Onyenwe anyị pụtara nọkụ ahụ ma gwa Mosis okwu.
Onyenwe anyị kwuru na Ya maara na Ndị Izrel na-ata ahụhụ niime Ijipt. O nyere Mosis iwu ịlaghachi Ijipt ma gwa Fero ikwe ka Ndị Izrel nwere onwe. Onyenwe anyị kwuru na Ya ga-enyere Mosis aka mee ka Ndị Izrel nwere onwe ha ma duru ha ruo ala e kwere na nkwa.
Ihu akwụkwọ A na-ete agba
Enwere M Ike Ịdị Obi ọma nye Ndị Ọzọ
Ngosipụta site nʻaka Audrey Day. Enwere ike ịkọpị ya maka ojiji nke Nzukọ nsọ naanị.
Kedụ ihe i nwere ike ime izu ụka nke a iji dịrị obi ọma?
© 2026 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa Ọnwa, Maachị 2026. Igbo. 19938 593