Friend
Mosis Onye amụma
Maachị 2026 Friend


“Mosis Onye amụma,” Friend, Maachị 2026, 46–48.

Ozi Friend Kwa Ọnwa, Maachị 2026

Mosis Onye amụma

Mosis yi uwe ndị Ijipt na-ele Onye Ijipt na-emekpa ohu onye Izrel ahụ

Mosis bụ Onye Izrel, mana a zụrụ ya site naka nwa ada Fero niime Ijipt. Obi jọrọ Mosis njọ na Ndị Ijipt nwere obi ọjọọ nʻebe Ndị Izrel nọ ma mee ha ndị ohu ha.

Mosis tinyere ogwe aka ya makọọ otu ohu ohu Ndị Izrel, na-akwado ya

Otu ụbọchị Mosis hụrụ otu Onye Ijipt na-akụ Onye Izrel ihe. Mosis chedoro Onye Izrel.

Mosis nọ naanị ya niime alaịkpa

Mgbe Fero chọpụtara, ọ naara achọ igbu Mosis, mana Mosis gbapụrụ site na Ijipt.

Mosis ya na nwunye ya na ụmụ ya

Mosis bịarutere nebe a na-akpọ Midian, ebe o zutere otu nwanyị akpọrọ Zipporah. Ha lụrụ di na nwunye ma mụọ ụmụ.

Mosis hụrụ Onyenwe anyị niime ọhịa na-ere ọkụ

Mgbe o bi niime Midian, Mosis hụrụ ọhịa na-ere ọkụ, mana ọkụ ahụ erechapụghị ọhịa. Onyenwe anyị pụtara nọkụ ahụ ma gwa Mosis okwu.

Onyenwe anyị na-agwa Mosis okwu

Onyenwe anyị kwuru na Ya maara na Ndị Izrel na-ata ahụhụ niime Ijipt. O nyere Mosis iwu ịlaghachi Ijipt ma gwa Fero ikwe ka Ndị Izrel nwere onwe. Onyenwe anyị kwuru na Ya ga-enyere Mosis aka mee ka Ndị Izrel nwere onwe ha ma duru ha ruo ala e kwere na nkwa.

Ihu akwụkwọ A na-ete agba

Enwere M Ike Ịdị Obi ọma nye Ndị Ọzọ

Ihu akwụkwọ PDF

Ngosipụta site nʻaka Audrey Day. Enwere ike ịkọpị ya maka ojiji nke Nzukọ nsọ naanị.

Kedụ ihe i nwere ike ime izu ụka nke a iji dịrị obi ọma?