“Noa na Igbe ahụ,” Friend, Febrụwarị. 2026, 46–48.
Ozi Friend Kwa ọnwa, Febrụwarị 2026
Noa na Igbe ahụ
Noa na ezi na ụlọ ya rubeere Onyenwe anyị isi. Ndị ọzọ niile nwere oke agwa ọjọọ. Onyenwe anyị gwara Noa na iju mmiri ga-ekpuchi elu ụwa ma ọ bụrụ na ndị mmadụ echegharịghị.
Noa gwara ndị ahụ na Onyenwe anyị hụrụ ha naanya ma chọọ ka ha chegharịa ma nwee okwukwe na Jizọs Kraịst. Ha achọghị ige ntị.
Onyenwe anyị gwara Noa ka o wuo otu nnukwu ụgbọ mmiri a kpọrọ igbe. Igbe ahụ ga-echekwa ezi na ụlọ Noa nʻoge iju mmiri.
Ezi na ụlọ Noa bubatara ihe oriri niime igbe ahụ. Onyenwe anyị zigaara Noa opekampe ụmụ anụmanụ abụọ nʻụdị ọbụla maka itinye niime igbe ahụ. Emesịa mmiri ozuzo malitere.
Mmiri zoro mkpụrụ ụbọchị 40 na abalị 40. Iju mmiri kpuchiri elu ụwa, dị nnọọ ka Onyenwe anyị si dọọ aka na ntị.
Ezi na ụlọ Noa na ụmụ anụmanụ niile nọ niime igbe ahụ sere na nchekwa nʻelu mmiri ahụ.
Mgbe iju mmiri ahụ kwụsịrị, igbe ahụ dara nʻala akọrọ. Noa na ezi na ụlọ ya ekele Onyenwe anyị maka ichekwa ha. Onyenwe anyị kwere nkwa na Ọ gaghị eji iju mmiri emebi ụwa ọzọ. O zitere egwurugwu dị ka ihe ncheta nke nkwa Ya.
Ihu akwụkwọ A na-ete agba
Isoro Onye amụma nke Onyenwe anyị Ga-agọzi M
Ngosipụta sitere n’aka Audrey Day
Kedu ihe I nwere ike ime iji soro onye amụma?
© 2026 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa Ọnwa, Febrụwarị 2026. Igbo. 19927 593