Friend
Noa na Igbe ahụ
Febrụwarị 2026 Friend


“Noa na Igbe ahụ,” Friend, Febrụwarị. 2026, 46–48.

Ozi Friend Kwa ọnwa, Febrụwarị 2026

Noa na Igbe ahụ

Ngosịpụta nke Noa na ezi na ụlọ ya na-elekọta atụrụ

Noa na ezi na ụlọ ya rubeere Onyenwe anyị isi. Ndị ọzọ niile nwere oke agwa ọjọọ. Onyenwe anyị gwara Noa na iju mmiri ga-ekpuchi elu ụwa ma ọ bụrụ na ndị mmadụ echegharịghị.

Noa na-ekwusa ozi ọma

Noa gwara ndị ahụ na Onyenwe anyị hụrụ ha naanya ma chọọ ka ha chegharịa ma nwee okwukwe na Jizọs Kraịst. Ha achọghị ige ntị.

Noa na ezi na ụlọ ya na-ewu igbe ahụ

Onyenwe anyị gwara Noa ka o wuo otu nnukwu ụgbọ mmiri a kpọrọ igbe. Igbe ahụ ga-echekwa ezi na ụlọ Noa nʻoge iju mmiri.

Ụmụ anụmanụ na-abanye nʻigbe ahụ

Ezi na ụlọ Noa bubatara ihe oriri niime igbe ahụ. Onyenwe anyị zigaara Noa opekampe ụmụ anụmanụ abụọ nʻụdị ọbụla maka itinye niime igbe ahụ. Emesịa mmiri ozuzo malitere.

Igbe ahụ na-ese nʻelu mmiri oke osimiri

Mmiri zoro mkpụrụ ụbọchị 40 na abalị 40. Iju mmiri kpuchiri elu ụwa, dị nnọọ ka Onyenwe anyị si dọọ aka na ntị.

Noa na ezi na ụlọ ya nọ niime igbe ahụ

Ezi na ụlọ Noa na ụmụ anụmanụ niile nọ niime igbe ahụ sere na nchekwa nʻelu mmiri ahụ.

Ezi na ụlọ Noa na ụmụ anụmanụ guzoro nʻala ahụ na-ele anya na-egwurugwu

Mgbe iju mmiri ahụ kwụsịrị, igbe ahụ dara nʻala akọrọ. Noa na ezi na ụlọ ya ekele Onyenwe anyị maka ichekwa ha. Onyenwe anyị kwere nkwa na Ọ gaghị eji iju mmiri emebi ụwa ọzọ. O zitere egwurugwu dị ka ihe ncheta nke nkwa Ya.

Ihu akwụkwọ A na-ete agba

Isoro Onye amụma nke Onyenwe anyị Ga-agọzi M

Ihu akwụkwọ PDF

Ngosipụta sitere n’aka Audrey Day

Kedu ihe I nwere ike ime iji soro onye amụma?