“Adam na Iv,” Friend, Jenụwarị 2026, 46–48.
Ozi Friend Kwa Ọnwa, Jenụwarị 2026
Adam na Iv
Adam na Iv bụụrụ ụmụ ndị mbụ nke Nna nke Eluigwe ịbị nʻụwa. Ha biri niime Ubi nke Iden.
Chineke hapụrụ ha iri mkpụrụ osisi nke osisi niile karịa otu. Ọ bụrụ ma ha rie site nʻosisi nke mmata ihe nke ezi ihe na ajọọ ihe, ha ga apụ nʻubi ahụ ma ga-anwụ nʻikpeazụ. Mana Setan gwara ha okwu asị. O kwuru na ọ bụrụ na ha rie mkpụrụ ahụ, ha ga-amara ezi ihe site na ajọọ ihe mana ha agaghị anwụ.
Iv họọrọ iri mkpụrụ osisi ahụ.
Mgbe ahụ ya enye Adam ụfọdụ mkpụrụ osisi ahụ. Ọ họkwaara iri mkpụrụ osisi ahụ.
Chineke na Jizọs Kraịst gara leta ha, mana Adam na Iv tụrụ ụjọ ma zoo. Chineke jụrụ ma ha eriwo mkpụrụ osisi sitere na osisi ahụ.
Adam na Iv kwuru na ha riri mkpụrụ osisi ahụ. Ugbu a ọ dị mkpa na ha hapụrụ Ubi nke Iden. Mana Chineke nwere atụmatụ maka ha. Ugbu a ha maara ezi ihe site na ajọọ ihe ma nwere ike ịmụ ụmụ.
Adam na Iv kwere nkwa irube isi nʻiwu nsọ niile nke Chineke. Ha mụtakwuru banyere Ọkpara nke Chineke, Jizọs Kraịst. Ha nwere obi ụtọ niihi na Ọ ga-enyere ezi na ụlọ ha aka lọghachikwuru Chineke.
Ihu akwụkwọ A na-ete agba
Jizọs Kere Ụwa
Ngosipụta site nʻaka Audrey Day
Kedụ ihe ndị bụ ihe ndị kacha masị gị Jizọs Kraịst kere?
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend kwa Ọnwa, Jenụwarị 2026. Igbo. 19919 593