Friend
Adam na Iv
Jenụwarị 2026 Friend


“Adam na Iv,” Friend, Jenụwarị 2026, 46–48.

Ozi Friend Kwa Ọnwa, Jenụwarị 2026

Adam na Iv

Adam na Iv niime Ubi nke Iden na ụmụ anụmanụ

Adam na Iv bụụrụ ụmụ ndị mbụ nke Nna nke Eluigwe ịbị nʻụwa. Ha biri niime Ubi nke Iden.

Osisi nke ndụ

Chineke hapụrụ ha iri mkpụrụ osisi nke osisi niile karịa otu. Ọ bụrụ ma ha rie site nʻosisi nke mmata ihe nke ezi ihe na ajọọ ihe, ha ga apụ nʻubi ahụ ma ga-anwụ nʻikpeazụ. Mana Setan gwara ha okwu asị. O kwuru na ọ bụrụ na ha rie mkpụrụ ahụ, ha ga-amara ezi ihe site na ajọọ ihe mana ha agaghị anwụ.

Iv na-atụtụ mkpụrụ osisi site nʻosisi nke mmata ihe nke ezi ihe na ajọọ ihe

Iv họọrọ iri mkpụrụ osisi ahụ.

Iv ji aka ya na-enye mkpụrụ osisi ahụ nʻaka nke Adam

Mgbe ahụ ya enye Adam ụfọdụ mkpụrụ osisi ahụ. Ọ họkwaara iri mkpụrụ osisi ahụ.

Adam na Iv na-ezo niime ọhịa mgbe Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst pụtara

Chineke na Jizọs Kraịst gara leta ha, mana Adam na Iv tụrụ ụjọ ma zoo. Chineke jụrụ ma ha eriwo mkpụrụ osisi sitere na osisi ahụ.

Adam na Iv yinyere uwe mwụda akpụkpọ anụ ma na-ahapụ Ubi nke Iden

Adam na Iv kwuru na ha riri mkpụrụ osisi ahụ. Ugbu a ọ dị mkpa na ha hapụrụ Ubi nke Iden. Mana Chineke nwere atụmatụ maka ha. Ugbu a ha maara ezi ihe site na ajọọ ihe ma nwere ike ịmụ ụmụ.

Adam na Iv na ezi na ụlọ ha

Adam na Iv kwere nkwa irube isi nʻiwu nsọ niile nke Chineke. Ha mụtakwuru banyere Ọkpara nke Chineke, Jizọs Kraịst. Ha nwere obi ụtọ niihi na Ọ ga-enyere ezi na ụlọ ha aka lọghachikwuru Chineke.

Ihu akwụkwọ A na-ete agba

Jizọs Kere Ụwa

Ihuakwụkwọ PDF

Ngosipụta site nʻaka Audrey Day

Kedụ ihe ndị bụ ihe ndị kacha masị gị Jizọs Kraịst kere?