“Ndị nsọ Gara Ọdịda anyanwụ,” Friend, Dizemba 2025, 26–28.
Ozi Friend Kwa ọnwa, Dizemba 2025
Ndị nsọ Gara Ọdịda anyanwụ
Mgbe Josef Smith nwụchara, Brigham Young na Ndịozi ndị ọzọ duru Nzukọ nsọ. Brigham Young maara na Ndị nsọ ga-ahapụ Nauvoo niihi enweghị nchekwa. Mana Onyenwe anyị chọrọ ka ha buru ụzọ wuchaa tempụl ahụ.
Mgbe tempụl ahụ dị na njikere, puku kwuru puku Ndị nsọ mere ọgbụgba ndụ ha na Onyenwe anyị ma arachie ha dị ka ndị ezi na ụlọ.
Ugbu a ọ bụ oge ịmalite njem ha gawa ọdịda anyanwụ. Ihu eluigwe naara atụ oyi, ma ndị mmadụ nọ nʻọrịa na agụrụ.
Brigham Kpere ekpere maka enyemaka. Onyenwe anyị kwuru ka ha nyerịtara onye na ibe ya aka, na Ọ ga-agọzi ha ma nyere ha aka.
Njem ahụ ka na-arakwa ezigbo ahụ. Ufọdụ ndị nwụrụ. Mana niihi ọgbụgba ndụ tempụl niile ha, Ndị nsọ maara na ha ga-ahụ ndị otù ezi na ụlọ ha ọzọ.
Ndị nsọ bu ụzọ bịaruru na Ndagwurugwu Salt Lake na 1847. Ebe a ha nwere ike ife Onyenwe anyị ofufe ma rụọ ọrụ Ya nʻudo.
Ka afọ na-aga, ọtụtụ Ndị nsọ bịarutere ma wukwuo ọtụtụ tempụl. Ndị mgbasa ozi ọma gazuru ụwa niile ikuzi ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta garaniihu ito eto, na-agọzi ụmụ Nna nke Eluigwe ebe niile.
Ibe akwụkwọ A na-ete agba
Ọ Bụ Ìhè, Ndụ, na Olileanya nke Ụwa
Ngosịpụta sitere n’aka Corey Egbert
Kedụ ihe ị na-eme nʻEkeresimesi iji echeta Jizọs Kraịst?
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa Ọnwa, Dizemba 2025. Igbo. 19637 593