“Jane Manning Mere Njem gaa Nauvoo,” Friend, Ọktoba 2025, 26–28.
Ozi Friend Kwa ọnwa, Ọktoba 2025
Jane Manning Mere Njem gaa Nauvoo
Ebe Jane Manning bibụrụ, ụfọdụ ndị mmadụ kpasoro ya agwa na-adịghị mma niihi agwà nke anụ ahụ ya. Otu ụbọchị, ọ nụrụ nkuzi nke ndị mgbasa ozi ọma. Oteghị aka e mere ya baptizim.
Emekwara ezi na ụlọ Jane baptizim. Ọ masịrị ha niile ịsonyere Ndị nsọ na Nauvoo Niihi ya ha malitere njem ha.
Ọ masịri ezi na ụlọ Jane ime njem site nʻụgbọ mmiri na mpaghara njem ahụ, mana ha enweghị ego ga-ezuru ha. Niihi ya ha jiri ụkwụ mee njem maịlụ 800 (1,300 km).
Ha kụfere otu iyi miri emi ma hie ụra nʻezi ebe oyi na-atụ. Mana ha mere mkpebi irute Nauvoo. Ha mere onwe ha obi ụto site na-ịbụ abụ dị ka ha na-aga ije.
ezi na ụlọ Jane jere ije tutu ruo mgbe akpụkpọ ụkwụ ha tara ma ụkwụ ha e nwee mmerụ ahụ. Mana ha kpere ekpere nye Chineke maka enyemaka, Ọ gwọrọ ụkwụ ha.
Ha nyeere ndị ha zutere nʻụzọ aka. Ha nyere aka ọbụna gwọo otu nwata dara ọrịa niihi okwukwe ha.
Nʻikpeazụ, Jane na ezi na ụlọ ya ruru Nauvoo! Mgbe Josef Smith nụrụ ihe niile ha gabigaworo, ọ gwara Jane, “Chineke gọzie gị. Unu nọ na nʻetiti ndị enyi ugbu a.”
Ihu akwụkwọ A na-ete agba
Jizọs Chọrọ ka M Hụ Onye niile Naanya
Ngosipụta sitere n’aka Corey Egbert
Olee otu i si egosi ndị ọzọ ịhụnaanya?
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa ọnwa, Ọktoba 2025. Igbo. 19630 593