2025
Ụlọ Mkpọrọ Libatị
Me 2025


“Ụlọ Mkpọrọ Libati,” Friend, Ọgọst 2025, 26–28.

Ozi Kwa Ọnwa nke Friend Ọgọst 2025

Ụlọ Mkpọrọ Libatị

Ụlọ ndị na-ere ọkụ na ndịikom iwe na-ewe ji egbe

Ọtụtụ ndị mmadụ na Missouri enweghị mmasị ebe Ndị nsọ nọ. Gọvanọ ahụ zigara ndị agha iji mee ka ha pụọ.

Nwoke nọ nʻelu ịnyịnya na-atụ mma agha nʻihu Joseph Smith

Ndị agha jidere Joseph Smith na ndị ndu ọzọ nke Nzukọ nsọ. Otu abalị, ndị nche ahụ nọ na-achị ọchị banyere ihe ọjọọ niile ha meworo ndị nsọ

Joseph Smith jiri ụdọ igwe kechiri mpịaji aka ya, na-eguzo ọtọ ma na-agwa ndịikom ahụ okwu

Joseph Smith guzoro ọtọ ma tie mkpu, “Gbaanụ nkịtị!” O kwuru okwu site nʻike nke Chineke. Ndị nche ahụ sịrị ndo ma kwụsị ikwu okwu.

Joseph Smith na ndịikom ndị ọzọ niime Ụlọ Mkpọrọ Libatị nọ nʻiwe ma nʻoyi ọtụtụ.

Emesịa, Josef Smith na ndị enyi ya ka akpọchiri niime ụlọ mkpọrọ nʻobodo ukwu akpọrọ Libati. Ụlọ mkpọrọ ahụ na-atụ oyi, pee mpe, ma gbaa ọchịchịrị. Ha nwere naanị akwà ruru unyi ha ga-arahụ ụra na ya. Nri enyere ha mere ka ha daa ọrịa.

Joseph Smit na-ebe akwa ma otu nwoke na-akasị ya obi

Josef nwere nchegbu maka Ndị nsọ. Mana enweghị ihe o nwere ike ime iji nyere ha aka.

Joseph Smit na-egbu ikpere ikpe ekpere nʻụlọ mkpọrọ

Josef kpere ọtụtụ ekpere. Ọ jụrụ ma Chineke echefuwo banyere ya na ndị otù Nzukọ nsọ.

Josef Smit na-esekpuru nʻala ụlọ mkpọro, na-eleli anya ya elu nʻebe ụzarị anyanwụ si na-achabata site na mpio.

Chineke zara ekpere Josef. O kwuru, “Nwa m nwoke, udo dịrị mkpụrụ obi gị.” Chineke gwara Josef na ịma aka ya niile agaghị adị ruo mgbe ebighị ebi nakwa na ha ga-abụ maka ọdịmma ya. O kwere nkwa na Ọ ga-anọnyere Josef “site nʻebighị ruo nʻebighị ebi” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:7, 46).

Ihuakwụkwọ a Na-ete agba

E Nwere M Ike Ịdị Ka Ihè nye Ndị ọzọ

Egwuregwu Ihuakwụkwọ a na-ete agba nke nwere ụlọihè, ikpere mmiri okwute okwute, na ụgbọmmiri na-ese nʻelu oke osimiri

Ngosipụta sitere n’aka Corey Egbert

Olee otu i si bụrụ ezi ọmụmatụ nye ndị ọzọ?