Ozi Friend Kwa ọnwa, Julaị 2025
Ndịozi Na-eje ozi na Great Britain
Onyenwe anyị gwara Joseph Smith ka o ziga ụfọdụ Ndịozi ije ozi na Great Britain. Ọ rara Ndịozi ahụ ịhapụ ndị ezi na ụlọ ha, mana Onyenwe anyị kwere nkwa ịgọzi ha.
Heber C. Kimball na nwunye ya, Vilate, nwere ezi na ụlọ dị nta. Ọtụtụ niime ha dara ezigbo ọrịa.
Brigham Young nọkwa nʻọrịa, ma ezi na ụlọ ya dara ogbenye. Mana nwunye Brigham Young, Mary Ann, gwara ya, “Gaa tinye akwụkwọ mishọn gị, ma Onyenwe anyị ga-agọzi gị.”
Heber na Brigham gbakere, mana ezigbo ike adịghị ha. Ha chọbuuru ikwusa ozi ọma, ya mere ha sịrị ndị ezi na ụlọ ha nọdụ nke ọma ma rigo na-azụ nke wagọn ahụ ịmalite njem ha.
Ka ogologo njem akufere oke osimiri gasịrị, Heber na Brigham rutere na Great Britain. Ha na Ndị ozi ndị ọzọ kuziiri ọtụtụ mmadụ ozi ọma. Puku kwuru puku ndị mmadụ ka e mere baptizim banye na Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst. Ọtụtụ niime ha kwọfere oke osimiri isonye Ndị nsọ nọ na United States.
Onyenwe anyị debere nkwa Ya ilekọta ndị ezi na ụlọ Heber na Brigham ebe ha na-ejere Ya ozi dị ka ndị mgbasa ozi ọma.
Ihu akwụkwọ a na-ete agba
Chineke Kere Ihe niile Ekereeke dị n’Elu ụwa
Ngosipụta sitere n’aka Corey Egbert
Gịnị bụ ihe ekereeke na-aka amasị gị?
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa Ọnwa, Julaị 2025. Igbo. 19639 593