2025
Ndịozi Na-eje ozi na Great Britain
Me 2025


Ozi Friend Kwa ọnwa, Julaị 2025

Ndịozi Na-eje ozi na Great Britain

Josef Smith na-eche nʻuche ya otu Ndịozi si na-ekwusa ozi ọma na Great Britain

Onyenwe anyị gwara Joseph Smith ka o ziga ụfọdụ Ndịozi ije ozi na Great Britain. Ọ rara Ndịozi ahụ ịhapụ ndị ezi na ụlọ ha, mana Onyenwe anyị kwere nkwa ịgọzi ha.

Ezi na ụlọ Kimball nọ nʻute ọrịa

Heber C. Kimball na nwunye ya, Vilate, nwere ezi na ụlọ dị nta. Ọtụtụ niime ha dara ezigbo ọrịa.

Brigham Young na-asị ezi na ụlọ ya nọọ nke ọma

Brigham Young nọkwa nʻọrịa, ma ezi na ụlọ ya dara ogbenye. Mana nwunye Brigham Young, Mary Ann, gwara ya, “Gaa tinye akwụkwọ mishọn gị, ma Onyenwe anyị ga-agọzi gị.”

Heber na Brigham ebu na-azụ wagọn

Heber na Brigham gbakere, mana ezigbo ike adịghị ha. Ha chọbuuru ikwusa ozi ọma, ya mere ha sịrị ndị ezi na ụlọ ha nọdụ nke ọma ma rigo na-azụ nke wagọn ahụ ịmalite njem ha.

Heber na Brigham na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma na Great Britain

Ka ogologo njem akufere oke osimiri gasịrị, Heber na Brigham rutere na Great Britain. Ha na Ndị ozi ndị ọzọ kuziiri ọtụtụ mmadụ ozi ọma. Puku kwuru puku ndị mmadụ ka e mere baptizim banye na Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst. Ọtụtụ niime ha kwọfere oke osimiri isonye Ndị nsọ nọ na United States.

Ndị ezi na ụlọ nke Heber na Brigham na-ekele ha nʻebe ọdọ ụgbọ mmiri

Onyenwe anyị debere nkwa Ya ilekọta ndị ezi na ụlọ Heber na Brigham ebe ha na-ejere Ya ozi dị ka ndị mgbasa ozi ọma.

Ihu akwụkwọ a na-ete agba

Chineke Kere Ihe niile Ekereeke dị n’Elu ụwa

Ihe omume nke ite nwolomgbo, erombụbara agba, na peeji okoko osisi niile PDF

Ngosipụta sitere n’aka Corey Egbert

Gịnị bụ ihe ekereeke na-aka amasị gị?