Ozi Friend Kwa ọnwa, Jun 2025
Na-ewu Tempụl Kirtland
Onyenwe anyị gwara Josef Smit na oge eruwo iwu tempụl na Kirtland, Ohio, USA. Ọ ga-abụ ebe pụrụ iche ebe Onyenwe anyị ga-eleta ndị Ya ma kwee ha ọtụtụ nkwa.
Ndị nsọ bidoro iwu tempụl. O furu nnukwu ego ma were nnukwu ọrụ. Mana ha nwere obi ụtọ ịnata ngọzi niile nke Onyenwe anyị.
Ka ndị Nsọ na-arụ ọrụ na tempụl ahụ, ego ha malitere ịgwụ. Ha kpere ekpere nye Chineke maka enyemaka.
Otu nwanyị aha ya bụ Caroline Tippets na ezinaụlọ ya chekwala nnukwu ego. Ha kwere ka Nzukọ nsọ gbaziri ego iji nye aka iwu tempụl ahụ.
Ndị nsọ rụsiri ọrụ ike. Ụfọdụ kwọro ụgbọala jupụtara na nkume. Ndị ọzọ meere ndị ọrụ ahụ uwe na erimeri.
Ụmụaka chịkọtara iberibe glaasị ndị wara awa maka igweri ha ma tinye ha na mgbidi niile nke tempụl ahụ ka ha na-egbuke egbuke na anwụ.
Nʻoge na-adịghị anya e wuchara tempụl ahụ! Ndị nsọ nwere obi ụtọ ịbanye niime ụlọ nke Onyenwe anyị ịnata ngọzi niile O kweworo ha na nkwa.
Ihu akwụkwọ a na-ete agba
Onyenwe anyị Maara Onye M bụ ma Ọ Hụrụ M naanya
Ngosipụta sitere n’aka Corey Egbert
See ihu gị niime oval. Olee otu isi mara na Jizọs Kraịst hụrụ gị naanya?
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa Ọnwa, Jun 2025. Igbo. 19643 593