2025
Na-ewu Tempụl Kirtland
Jun 2025


Ozi Friend Kwa ọnwa, Jun 2025

Na-ewu Tempụl Kirtland

Josef Smith na ndị ọzọ na-elepụ anya nʻalaubi ghere oghe

Onyenwe anyị gwara Josef Smit na oge eruwo iwu tempụl na Kirtland, Ohio, USA. Ọ ga-abụ ebe pụrụ iche ebe Onyenwe anyị ga-eleta ndị Ya ma kwee ha ọtụtụ nkwa.

Ndị mmadụ na-ebido iwu Tempụl Kirtland

Ndị nsọ bidoro iwu tempụl. O furu nnukwu ego ma were nnukwu ọrụ. Mana ha nwere obi ụtọ ịnata ngọzi niile nke Onyenwe anyị.

Nwoke na-ekpe ekpere na ndị ọrụ nọ nso

Ka ndị Nsọ na-arụ ọrụ na tempụl ahụ, ego ha malitere ịgwụ. Ha kpere ekpere nye Chineke maka enyemaka.

Nwanyị nọ nʻụgbọala na-ele tempụl Kirtland ahụ arụchabeghị

Otu nwanyị aha ya bụ Caroline Tippets na ezinaụlọ ya chekwala nnukwu ego. Ha kwere ka Nzukọ nsọ gbaziri ego iji nye aka iwu tempụl ahụ.

Ụmụaka ji ekete na-anakọta glaasị nʻihu Tempụl Kirtland ahụ arụchabeghị

Ndị nsọ rụsiri ọrụ ike. Ụfọdụ kwọro ụgbọala jupụtara na nkume. Ndị ọzọ meere ndị ọrụ ahụ uwe na erimeri.

Ụmụaka chịkọtara iberibe glaasị ndị wara awa maka igweri ha ma tinye ha na mgbidi niile nke tempụl ahụ ka ha na-egbuke egbuke na anwụ.

Ndị mmadụ na-ele Tempụl Kirtland ahụ arụchaworo

Nʻoge na-adịghị anya e wuchara tempụl ahụ! Ndị nsọ nwere obi ụtọ ịbanye niime ụlọ nke Onyenwe anyị ịnata ngọzi niile O kweworo ha na nkwa.

Ihu akwụkwọ a na-ete agba

Onyenwe anyị Maara Onye M bụ ma Ọ Hụrụ M naanya

Okwu emegharịrị

Ngosipụta sitere n’aka Corey Egbert

See ihu gị niime oval. Olee otu isi mara na Jizọs Kraịst hụrụ gị naanya?