2025
Lucy Wee Chọta Eziokwu ahụ
Eprel 2025


“Lucy Wee Chọta Eziokwu ahụ,” Friend, Eprel 2025, 26-28.

Ozi Friend Kwa Ọnwa, Eprel 2025

Lucy Wee Chọta Eziokwu ahụ

Nwata nwanyị na-emepe ọnụ ụzọ ịkpọbata otù ndịikom ebe otu onyeinyom na-anọdụ ọdụ ebe a na-ekwe akwa

Otu ụbọchị, Lucy Morley gbara afọ 15 nọ na-enyere onye agbata obi ya, Abigail Daniels aka, ikwe akwa. Dị ka ha na-arụ ọrụ, ndị mgbasa ozi ọma atọ kụrụ aka nʻọnụ ụzọ. Ha kwuru na Jizọs Kraịst ezitewo ha ikesa ozi.

Onyeinyom nọdụrụ ebe a na-ekwe akwa agbarụọ ihu mgbe ndịikom ahụ na obere nwantakịrị nwanyị ahụ na-ekwu okwu

Ndịikom ahụ gwara Abigail na Lucy na Jizọs akpọworịị Joseph Smith ịbụ onye amụma. Ha gwakwara ha banyere Akwụkwọ nke Mọmọn.

Onyeinyom iwe na-ewe na-achụpụ ndịikom site nʻebe obibi ya

Nʻịtụnaanya nke Lucy, iwe were Abigail. O mere ka ndị mgbasa ozi ọma ahụ pụọ.

Ndịikom elee anya na-azụ ebe nwantakịrị nwanyị na-achụ ha ọsọ

Lucy maara na ndị mgbasa ozi ọma ahụ bụụrụ ụmụ odibo nke Chineke. Ọ gwara ha ịga leta ezi na ụlọ ya na mgbada ụzọ ahụ.

Ndịikom nọdụrụ na tebuulu nri anyasị ha na nwantakịrị nwanyị na ezi na ụlọ ya

Ndị mgbasa ozi ọma gara nʻebe obibi Morley ha. Ndị nne na nna Lucy kpọkuru ndị mgbasa ozi ọma ikuziri ha na ndị enyi ha.

Nwantakịrị nwanyị na itinye akwa mmiri gburugburu ubu onyeinyom ebe a na-eme onye ọzọ baptizim nʻosimiri nọ na-azụ

Na abalị ahụ, e mere mmadụ 17 baptizim. Niime ụbọchị ole ma ole na-esote, mmadụ 50 ọzọ nụrụ site nʻaka ndị mgbasa ozi ọma ahụ ma e mere ha baptizim. Ọbụna onye agbata obi nke Lucy Abigail gbanwere obi ya. Ya na di ya, nakwa Lucy na ndị otu ezi na ụlọ ya, họọrọ isoro Jizọs Kraịst site na-ime baptizim.

Ihu akwụkwọ a na-ete agba

Niihi Jizọs Kraịst, Aga M Ebilite n’ọnwụ

ahịrịnka nke ili tọgbọrọ n’efu

Ngosipụta sitere n’aka Corey Egbert

Olee otu i si echeta Jizọs na Ista?