“Lucy Wee Chọta Eziokwu ahụ,” Friend, Eprel 2025, 26-28.
Ozi Friend Kwa Ọnwa, Eprel 2025
Lucy Wee Chọta Eziokwu ahụ
Otu ụbọchị, Lucy Morley gbara afọ 15 nọ na-enyere onye agbata obi ya, Abigail Daniels aka, ikwe akwa. Dị ka ha na-arụ ọrụ, ndị mgbasa ozi ọma atọ kụrụ aka nʻọnụ ụzọ. Ha kwuru na Jizọs Kraịst ezitewo ha ikesa ozi.
Ndịikom ahụ gwara Abigail na Lucy na Jizọs akpọworịị Joseph Smith ịbụ onye amụma. Ha gwakwara ha banyere Akwụkwọ nke Mọmọn.
Nʻịtụnaanya nke Lucy, iwe were Abigail. O mere ka ndị mgbasa ozi ọma ahụ pụọ.
Lucy maara na ndị mgbasa ozi ọma ahụ bụụrụ ụmụ odibo nke Chineke. Ọ gwara ha ịga leta ezi na ụlọ ya na mgbada ụzọ ahụ.
Ndị mgbasa ozi ọma gara nʻebe obibi Morley ha. Ndị nne na nna Lucy kpọkuru ndị mgbasa ozi ọma ikuziri ha na ndị enyi ha.
Na abalị ahụ, e mere mmadụ 17 baptizim. Niime ụbọchị ole ma ole na-esote, mmadụ 50 ọzọ nụrụ site nʻaka ndị mgbasa ozi ọma ahụ ma e mere ha baptizim. Ọbụna onye agbata obi nke Lucy Abigail gbanwere obi ya. Ya na di ya, nakwa Lucy na ndị otu ezi na ụlọ ya, họọrọ isoro Jizọs Kraịst site na-ime baptizim.
Ihu akwụkwọ a na-ete agba
Niihi Jizọs Kraịst, Aga M Ebilite n’ọnwụ
Ngosipụta sitere n’aka Corey Egbert
Olee otu i si echeta Jizọs na Ista?
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa Ọnwa, Eprel 2025. Igbo. 19631 593