2025
Eweghachitewo Ọkwa Nchụaja Ahụ
Maachị 2025


“Eweghachitewo Ọkwa Nchụaja Ahụ,” Friend, Maachị 2025, 26–28.

Ozi Kwa Ọnwa Friend Maachị 2025

Eweghachitewo Ọkwa Nchụaja Ahụ

I nwere ike ịgụ akụkọ nke a niime Agụgụala—Joseph Smith 1:66–73 na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 27:12.

Joseph Smith na-agwa Oliver Cowdery okwu ebe enwere ihe osise okirikiri echiche echere nʻuche na-egosi Kraịst na-eleta ndị Nifaị

Mgbe Joseph Smith natasiworo epekele ọlaedo niile, ọ malitere ịtụgharị asụsụ ha. Oliver Cowdery dedatara ihe o kwuru. Dị ka ha na-arụ ọrụ, ha mụtara na Jizọs Kraist chọrọ ka emee onye niile baptizim.

Joseph Smith na Oliver Cowdery na-ekpe ekpere nʻebe ọdọ osisi.

Joseph na Oliver chere maka onye nwere ike nke Chineke iji mee ndị mmadụ baptizim. Ha bara niime ọdọ osisi ikpe ekpere ma rịọ Chineke.

Mmụọ ozi debere aka ya nʻelu isi Joseph Smith

Dị ka ha na-ekpe ekpere, otu mmụọ ozi pụtara. O kwuru na ọ bụ Jọn Omee Baptizim onye mere Jizọs Kraịst baptizim ọtụtụ oge gara aga. O nyere Joseph na Oliver Ọkwa Nchụaja nke Erọn ka ha nwee ike mee ndị ọzọ baptizim. Ọkwa nchụaja ahụ bụ ike nke Chineke A na-eji ya agọzi ụmụ Chineke.

Joseph Smith na-eme Oliver Cowdery baptizim

Jọn Omee Baptizim gwara Joseph na Oliver ka emee ha baptizim. Ha bara niime osimiri ahụ ma mekọrịta onwe ha baptizim. Mgbe ha sitere na mmiri ahụ pụta, ha juputara na Mmụọ Nsọ. Ha nwere ezigbo obi ụtọ!

Ndị Mmụọ ozi atọ debere aka ha nʻelu isi Joseph Smith

Emesịa, ndị mmụọ ozi ọzọ bịara. Ndị Ozi atọ niime Ndị ozi Jizọs Kraist—Pita, Jemis, na Jọn—nyere Joseph na Oliver Ọkwa Nchụaja Melkizedek. Ugbua Joseph na Oliver nwere ike inye ndị ọzọ onyinye nke Mmụọ Nsọ.

Ihu akwụkwọ A na-ete agba

Jizọs Hụrụ Egwu nke Obi Naanya

Obi nke akara egwu dị niime

Ngosipụta sitere n’aka Corey Egbert

Kedụ ụdị mmetụta ị na-enwete mgbe ị na-abụ abụ banyere Jizọs Kraist?