“Eweghachitewo Ọkwa Nchụaja Ahụ,” Friend, Maachị 2025, 26–28.
Ozi Kwa Ọnwa Friend Maachị 2025
Eweghachitewo Ọkwa Nchụaja Ahụ
I nwere ike ịgụ akụkọ nke a niime Agụgụala—Joseph Smith 1:66–73 na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 27:12.
Mgbe Joseph Smith natasiworo epekele ọlaedo niile, ọ malitere ịtụgharị asụsụ ha. Oliver Cowdery dedatara ihe o kwuru. Dị ka ha na-arụ ọrụ, ha mụtara na Jizọs Kraist chọrọ ka emee onye niile baptizim.
Joseph na Oliver chere maka onye nwere ike nke Chineke iji mee ndị mmadụ baptizim. Ha bara niime ọdọ osisi ikpe ekpere ma rịọ Chineke.
Dị ka ha na-ekpe ekpere, otu mmụọ ozi pụtara. O kwuru na ọ bụ Jọn Omee Baptizim onye mere Jizọs Kraịst baptizim ọtụtụ oge gara aga. O nyere Joseph na Oliver Ọkwa Nchụaja nke Erọn ka ha nwee ike mee ndị ọzọ baptizim. Ọkwa nchụaja ahụ bụ ike nke Chineke A na-eji ya agọzi ụmụ Chineke.
Jọn Omee Baptizim gwara Joseph na Oliver ka emee ha baptizim. Ha bara niime osimiri ahụ ma mekọrịta onwe ha baptizim. Mgbe ha sitere na mmiri ahụ pụta, ha juputara na Mmụọ Nsọ. Ha nwere ezigbo obi ụtọ!
Emesịa, ndị mmụọ ozi ọzọ bịara. Ndị Ozi atọ niime Ndị ozi Jizọs Kraist—Pita, Jemis, na Jọn—nyere Joseph na Oliver Ọkwa Nchụaja Melkizedek. Ugbua Joseph na Oliver nwere ike inye ndị ọzọ onyinye nke Mmụọ Nsọ.
Ihu akwụkwọ A na-ete agba
Jizọs Hụrụ Egwu nke Obi Naanya
Ngosipụta sitere n’aka Corey Egbert
Kedụ ụdị mmetụta ị na-enwete mgbe ị na-abụ abụ banyere Jizọs Kraist?
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa Ọnwa, Maachị 2025. Igbo. 19636 593