“Joseph Smith Natara Epekele Ọlaedo niile,” Friend, Febrụwarị 2025, 26–28.
“E nwere m Ike Ị bụ Onye aka ebe Na Akwụkwọ nke Mọmọn Bụ Eziokwu,” Friend, Febrụwarị 2025, 48.
Ozi Friend Kwa ọnwa, Febrụwarị 2025
Joseph Smith Natara Epekele Ọlaedo niile ahụ
I nwere ike ịgụ akụkọ nke a niime Agụgụala—Joseph Smith 1:28-60.
Afọ atọ mgbe Ọhụ Mbụ gasịrị, Joseph Smith nwere mwute gbasara ụfọdụ njọ o mere. O kpere ekpere nye Nna nke Eluigwe banyere ya.
Ebe o nọ na-ekpe ekpere, ihè juputara ime ụlọ ahụ. Ọ hụrụ onye mmụọ ozi guzoro n’ikuku. Aha onye mmụọ ozi ahụ bụ Moronaị.
Moronaị kwuru na e nwere otu akwụkwọ ejiri ọlaedo mee ibe akwụkwọ niile, ma ọ bụ epekele niile. Eliri ya niime ugwu nta nọ nso n’ebe obibi nke Joseph. Akwụkwọ ahụ bụ gbasara ndị biiri na Amerịka ọtụtụ oge gara aga. Moronaị kwuru na Chineke ga-enyere Joseph aka tụgharịa akwụkwọ ahụ.
Joseph gara n’ugwu nta ahụ ma chọta epekele niile ahụ n’okpuru otu nkume arụ. Moronaị bịara ma kwuo na Joseph adịghị na njikere iwere ha mgbe ahụ.
Mgbe Joseph metụrụ okenye, Moronaị zutere ya nʻelu ugwu ma nye ya epekele niile ahụ. Moronaị gwara Joseph ichekwa ha nke ọma.
Joseph malitere ịtụgharị asụsụ epekele niile ahụ na-asụsụ bekee. O jiri ngwa ndị sitere n’aka Chineke inyere ya aka. Akwụkwọ ahụ ka ebipụtara na 1830 dị ka Akwụkwọ nke Mọmọn. Ọ na-akụzi gbasara Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya.
Ihu akwụkwọ A na-ete agba
E nwere m Ike Ị bụ Onye aka ebe Na Akwụkwọ nke Mọmọn Bụ Eziokwu
Ngosipụta sitere n’aka Corey Egbert
Kedụ otu ị ga-esi enyere ndị ọzọ aka mụọ ihe banyere Jizọs Kraịst dị niime Akwụkwọ nke Mọmọn?
© 2025 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa Ọnwa, Febrụwarị 2025.. Igbo. 19641 593