2025
Joseph Smith Natara Epekele Ọlaedo niile ahụ
Febrụwarị 2025


“Joseph Smith Natara Epekele Ọlaedo niile,” Friend, Febrụwarị 2025, 26–28.

“E nwere m Ike Ị bụ Onye aka ebe Na Akwụkwọ nke Mọmọn Bụ Eziokwu,” Friend, Febrụwarị 2025, 48.

Ozi Friend Kwa ọnwa, Febrụwarị 2025

Joseph Smith Natara Epekele Ọlaedo niile ahụ

I nwere ike ịgụ akụkọ nke a niime Agụgụala—Joseph Smith 1:28-60.

Joseph Smith na-elepụ anya n’ọnụ mpio

Afọ atọ mgbe Ọhụ Mbụ gasịrị, Joseph Smith nwere mwute gbasara ụfọdụ njọ o mere. O kpere ekpere nye Nna nke Eluigwe banyere ya.

Joseph Smit na-egbu ikpere n’ekpe ekpere

Ebe o nọ na-ekpe ekpere, ihè juputara ime ụlọ ahụ. Ọ hụrụ onye mmụọ ozi guzoro n’ikuku. Aha onye mmụọ ozi ahụ bụ Moronaị.

Mmụọ ozi Moronaị na-eleta Joseph Smith niime ụlọ ya

Moronaị kwuru na e nwere otu akwụkwọ ejiri ọlaedo mee ibe akwụkwọ niile, ma ọ bụ epekele niile. Eliri ya niime ugwu nta nọ nso n’ebe obibi nke Joseph. Akwụkwọ ahụ bụ gbasara ndị biiri na Amerịka ọtụtụ oge gara aga. Moronaị kwuru na Chineke ga-enyere Joseph aka tụgharịa akwụkwọ ahụ.

Joseph Smith gbara na-enyoba anya niime olulu ịhụ epekele niile ahụ.

Joseph gara n’ugwu nta ahụ ma chọta epekele niile ahụ n’okpuru otu nkume arụ. Moronaị bịara ma kwuo na Joseph adịghị na njikere iwere ha mgbe ahụ.

Mmụọ ozi Moronaị na-agwa Joseph Smith okwu

Mgbe Joseph metụrụ okenye, Moronaị zutere ya nʻelu ugwu ma nye ya epekele niile ahụ. Moronaị gwara Joseph ichekwa ha nke ọma.

Joseph Smith na-agwa otu ezi na ụlọ okwu

Joseph malitere ịtụgharị asụsụ epekele niile ahụ na-asụsụ bekee. O jiri ngwa ndị sitere n’aka Chineke inyere ya aka. Akwụkwọ ahụ ka ebipụtara na 1830 dị ka Akwụkwọ nke Mọmọn. Ọ na-akụzi gbasara Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya.

Ihu akwụkwọ A na-ete agba

E nwere m Ike Ị bụ Onye aka ebe Na Akwụkwọ nke Mọmọn Bụ Eziokwu

Ihu akwụkwọ a na-ete agba nke otu nwata nwanyị ku Akwụkwọ nke Mọmọ n’obi ya

Ngosipụta sitere n’aka Corey Egbert

Kedụ otu ị ga-esi enyere ndị ọzọ aka mụọ ihe banyere Jizọs Kraịst dị niime Akwụkwọ nke Mọmọn?