“Nifaị Wee Hụ Nwata Jizọs,” Friend, Dizemba 2024, 26–27.
Ozi nke Friend Kwa Ọnwa, Dizemba 2024
Nifaị Wee Hụ Nwata Jizọs
Ngosipụta niile site n’aka Andrew Bosley
Nna nke Nifaị, Lehi, hụrụ ọhụ banyere Jizọs Kraịst. Nifaị chọburu ịhụ ọhụ nke a kwa. O kpere ekpere ma rịọ ịhụihe ihe nke nna ya hụrụ.
Mmụọ Nsọ gosịrị Nifaị otu ọhụ ahụkwa. Nifaị hụrụ otu nwata nwanyị a kpọrọ Meri. Mmụọ Nsọ sịrị na ọ ga-abụ nne nke Ọkpara nke Chineke, Jizọs Kraịst.
Nifaị hụrụ nwata Jizọs ya na Meri. Mmụọ Nsọ ahụ sịrị na Jizọs ga-abịa nʼụwa inyere ụmụ Nna nke Eluigwe aka.
Nifaị hụrụ ndụ nke Jizọs Kraịst. Ọ hụrụ Ya ka ọ na-eje ozi ma na-akuziri ndị mmadụ ihe. Nifaị mụtara ọtụtụ ihe gbasara Onye Nzọpụta. I nwekwara ike mụọ ihe gbasara Ya site n’ịgụ akwụkwọ nsọ.
Ihu akwụkwọ A na-ete agba
Ekeresimesi Bụ gbasara Jizọs
Ngosipụta site n’aka Adam Koford
“Niihi na amụworo anyị otu nwa, enyewo anyị otu nwa nwoke” (Aịzaya 9:6).
© 2024 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa Ọnwa, Dizemba 2024. Igbo. 19350 593